Buhari akpọghachiela onyeisi NHIS a na enyo enyo

Yusuf Usman Image copyright NHIS
Nkenke aha onyonyo Minsita ahụike sị na a sị ya na Yusuf Usman rụkọwa ọrụ nke ọma

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari akpọgzhachiela onyeisi ụlọ ọrụ na ahụ maka ahụike nke a na-akpọ National Health Insurance Scheme (NHIS) bụ Usman Yusuf.

Minista ahụike bụ Isaac Adewole nyere Yusuf ezumike ọrụ na onwa Jun nke afọ 2017 ka a na atụ aka na Yusuf tinyere aka na mpụ.

Otu nyocha Minista ahuike họpụtara mechara si na Yusuf mere mpụ gbasara izu ego ohanama nakwa ime ịma mmadụ banyere ọrụ ya.

Ụlọ nta akụkọ Premium Times na akọwa na Buhari eleteghị anya na akwụkwọ otu nyocha a mepụtara tupu o kpọhachịe Yusuf.

Ụlọ nta akụkọ ahu na ekwukwa na ọ na mgbede ụnyahụ ka ezịgara Adewole akwụkwọ mkpọhachị Yusuf.

Akwụkwọ mkpọhachi a siri Adewole ya soro Yusuf rụkọ ọrụ ma o laghachite.

Anyi ga esoro akụkọ a taa, ma wetekwara ụnụ etu o siri kwụrụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara