Basket Bọọlụ: D'Tigress eketala oke asọmpị

D'Tigress Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo 2018 FIBA World Cup: Nigeria ga e so Argentina sọmpị

D'Tigress bụ otu egwuregwu basket bọọlụ nke umu nwanyị Naịjiria eketala oke asọmpị basket bọọlụ nke ụmụ nwanyị n'ụwa niile ga agba n'onwa setemba afọ a.

D'Tigress ga esoro Argentina, Turkey na Australia sọmpị n'asọmpị FIBA Women's World Cup nke ga eme na Tenerife dị na Spain bido 22 ruo 30 setemba.

D'Tigress bụ ndị bu iko basket bọọlụ nke Afrịka.

Na mmememe eji họpụta oke asọmpị s emere ụnyahu na Teatro Leal, San Cristobal de la Laguna, Korea, Greece, Canada na France ketere Group A, ka Spain, Japan, Puerto Rico na Belgium nọ Group C.

Ndị Afrịka ndị ọzọ so n'asọmpị a bu Senegal so Latvia, USA na China nọrọ na oke group D.

A ga agba bọọlụ nke oke na Tenerife Sports PavilionSantiago Martin nọ na San Cristóbal de La Laguna nakwa Palacio Municipal de Deportes di na Santa Cruz.

A ga agaba nke mgbacha na Tenerife Sports Pavilion Santiago Martin.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Naịjirịa na Senegal bụ ndị Afrịka nọ Asọmpị.

Onye na akụziri D'Tigress bụ Sam Vincent si na ọ ụgbụa ka nkwadọ iko uwa niile ha bidoro.

"Obi di mu ụtọ ma sikwa mụ ike maka ebe anyị nọ," Vincent kwuru.

Onye na agba bọọlụ na Dallas Wings na mba Amerịka bụ Evelyn Akhator, bụkwa onye nyere ndị D'Tigress ezigbote aka na mmeri ha meriri na FIBA nke Afrịka na atụ anya na ha ga eje kari ka ha jere na 2006 mgbe ha apụtaghi na ọgba nke oke.

"E che m na ihe a ga bụ ezigbo ọpụpu banyere anyị maka anyi na Australia, Turkey na Argentina nọ na oke. ekiriam ndị Turkey ka ha na agba bọọlụ. Ya mere obi jiri ka m na anyị ga emeri ha."

Ihe onye ọnụ na eru n'okwu ihe gbasara egwuregwu b Emeka offor kwuru maka ohere D'Tigress nwere:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionD'Tigress a ga-emerị asọmpị FIBA?

Isiokwu Ndị Emetụtara