Port Harcourt e kporola ọkụ taa n'ekeremgba

Oduayo Adekuoroye na African Wrestling Championship Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oduayo Adekuoroye napụrụ onye Japan ọla edo na mgba ndị dara 55kg n'afọ 2017

Tata bụ Wesde, Eke 7-2-18 ka ekeremgba an akụ n'Alfred Diete Spiff Civic Centre, Pitakwa na-egwuruegwu nke Wrestling Championship nke mba Afrika.

Ya bụ ọgbọ egwuruegwu ga-anabata ike ka ike n'ekeremgba na mba iri abụọ na ise n'Africa.

Ha ga azọ ihe nrite ọla ọcha na ọla edo karịrị otu narị na iri asatọ, dịka TheGuardian siri buo.

Mba Egypt, Naịjirịa na Tunisia kachasị ewete ịhe nrita egwuruegwu a na-mbụ.

Nke mba Afrika biagoro egwuruegwu a

Dịka nta akụkọ siri kwuo mba iri na otu ndị Afrika a wuchilearị na Port Harcourt.

Mba ndị a bụ Kenya, Namibia, Liberia, Burundi, South Africa, Tunisia, Egypt, Morocco, Algeria and Sudan. Ebe a na-atu anya ndị ọzọ na-ụbọchị na-abia n'ihụ.

Onye nọ n'isi ịhazị ya bụ egwuruegwu bekee kpọrọ Chairperson of the LOC, Boma Iyaye bụkwụ Kọmishona egwuruegwu dị na-aka na River Steeti sịrị na-ihe niile ezuola maka nkwado ya bụ egwuruegwu.

Boma jikwa ohere a kele Gọvanọ Wike maka ịkwado ya bụ egwuruegwu mba Afrika.

A na atụ anya ndị niile Naịjrịa jị eme ọnụ n'ekeremgba n'ọgbọ a.

Ndị dịka Oduayo Adekuoroye bụgoro ọkamgba nke mba Afrika ụgbọro asaa, Blessing Oborodudu nakwa Nwafọ Igbo bụ Ifeoma Nwonye bụ ọkamgba nke ụmụnwaanyị ụgbọro ise na mba Afrika.

Nkea bụ mbụ a na-eme egwuruegwu a na Naịjirịa nke ụmụnwoke na ụmụnwaanyị so agba.

Anyi ka agba mbọ i kwuru onye nhazi egwuruegwu a dị na-aka na River steeti