Police Steeti ga-eme ka mmadụ ṅụọ mmirri tọgbọ ikọ

Yemi Osibanjo na Abuja
Nkọwa foto,

Yemi Osibanjo kwetara na ịhapụ steeti ọbụla ka ha nwee ndị uweojii nke ha bụ ihe ga ebeleta mkpamkpa na akpa na Naịjirịa ugbu a

Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo etinyela ọnụ n'okwu ndị kwetara na ọ dị mkpa ịhapụ ndị

steetị obụla ka ha nwee ndị uwe ojii nke ha.

Osiri na ọnụogụ Naịjirịa kariri ndị uweojii enwere ugbua dịka otumba uwa bụ UN sịri tuzie.

O kwuru nke a na-ọgbakọ ndị Sineti kpọro maka nchekwa obodo n'Abuja tata bụ Thursday orie.

Osote onyeisiala siri na Naịjirịa ebuka ị nọ n'Abuja na ahazi maka nchekwa obodo.

O kwukwara na polisi nke steeti na ndị nche ime obodo bụ ihe ga-eme ka udo lọghachịte n'obodo Naịjirịa.

Ọ bụ maka mkpamkpa na-akpa na Naịjirịa ugbua mere e ji kpọ ọgbakọ a.

Yemi Osinbanjo Sikwara na gọmentị kwesiri itinyekwu ego n'ego a na-amaputa maka nchekwa obodo.

Ọ dọkwara aka na nti ka "aghara ị gbakwụghe ihe gbasara okwukwe uka na nke agburu ebe mmadụ si na-okwu a na-ese".

Ọ sịkwara na Naịjirịa na ndị agbataobi ya kwesiri ị gbakọaka gbochie ndi amakaekwu ji mkpụmkpụ egbe agafe obodo ndị a.