Naijiria etinyela udu mmanụagbịdị 225,000 n'ihe a na-emepụta

Ụlọọrụ na-egwupụta mmanụ agbidi Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Mmanụ agbịdị Naijiria na-egwupụta gbagoro kemgbe ndị agha nnupụisi Naija-Delta belatara mkpamkpa ha na-akpa na mpaghara ahụ

Emechiburu ebe a na-egwupụta mmanụ agbịdị na Bonga iji nye ohere maka nrụzi.

Dịka akwụkwọ akụkọ Vanguard sir kwuo, ọ bụ Shell, ụlọọrụ na-egwupụta mmanụ mere nrụzị ahụ nke mere ka ha na egwupụtazi udu mmanụ dara karịa nde dola isii n'ọnụ ọ dara n'ahịa mmanụ ugbua.

Dika ozi siri kwuo, udu mmanụ ruru otu nde(one million barrels) hapụrụ ọdụ mmanụ nke Bonga na ime ụgbọmmịrị , a kpọrọ 'Suezmax Narmada Spirit' gawa ahịa mba ofesi n'ụbọchị Wenezde.

Shell kwuru n'oge gara aga na ha ga-ebido nrụzi ebe ngwupụta mmanụ dị na Bonga iji mee ka ọrụ ha ebe ahụ na-aga dịka ọ kwesịrị.

Ọnụ na-ekwuchitere Shell bụ Bamidele Odugbesan,kwuru na akwụkwọ ọzị O depụrụ na "nrụzị a ga enye aka hụ na anyị gara n'ihu na ngwpụta mmanụ ma wepụ arụkata akwụsi akpaghị akpa."