Lai Mohammed: Amaghị m na EFCC na-enyocha Yusuf

Lai Mohammed, Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Lai Mohammed ekwuola na ọ maghị na EFCC na-enyocha onyeisi ngalaba ịnshọransị ahụike bụ Yusuf

Lai Mohammed kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde mgbe ọ na-asa ndị ntaakụkọ okwu ka emechara nzukọ ndị ime obi nke gọọmentị etiti.

O siri na ọ maghị na ngalaba na-ahụ maka ibu agha megide mpụ na mmerụaka na-enyocha onyeisi ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ịnshọransị ahụike bụ Usman Yusuf, maka ebubo eboro ya.

Na'afọ gara aga, Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Prof. Isaac Adewole, kwụsịrị Yusuf ọrụ n'ike ganye mgbe EFCC ga-emecha nyocha ebubo na o (Yusuf) mefuru nde otu narị iri itoolu na otu naira na mpụ ndị ọzọ.

Mana onyeisi ala bụ Muhammadu Buhari nyere iwu ga-akpọghachi ya n'ọrụ.

Lai Mohammed sịrị: "Amaghị na EFCC na-enyocha Yusuf onye nke akpọghachiri n'ọrụ. Ma ka o si na dị, e cheghị na mkpọghachi ya ga-egbochi nyocha ọbụla."

"Na akpọghachiri n'ọrụ apụtaghị na EFCC agaghị aga n'ihu na nyocha ya."