'Di m ji akụrụ m mejuo ụgwọ isi m'

Aka yi glọv nara sịzọs, ebe aka ọzọ ji owu Image copyright Getty Images

Nwaanyị a kwuru na e wepụrụ akụrụ ya mgbe ya amaghị.

Aka ndị uweojii akparala di otu nwaanyị na ọgọ ya nwoke maka na ha zuru otu akụrụ iji mejuo ụgwọisi ya.

ụlọọrụ akụkọ nke ọdịda anyanwụ Benghal kwuru na di nwaanyị kwadoro ya owawa afọ maka apenditis mgbe o nwere afọ mgbu afọ abụọ gara aga.

Mana na ngwucha afọ 2017, nyocha abụọ o mere gosiri na otu n'ime akụrụ ya na-efu efu.

Nwanyi ahụ kwụrụ n' oge niile ka dị ya na-ekwu okwu ka a kwụọ ya ụgwọ isi ya.

Kemgbe afọ 1961 ka iwu badidoro ịkwụ ụgwọ isi nke dịka omenaala ha siri dị, the ezinaụlọ agbọghọ na-akwụ dị ya.

Nwaanyị a aha ya bụ Rita Sarkar kwara ndị ntaakụkọ na ya ahụla mmekpa ahụ ọtụtụ afọ maka ihe gbasara ụgwọ isi ya.

Ọ kwara ụlọọrụntaakụkọ Hindustan Times sị: "Di m kpọgara m ụlọọgwụ dị na Kolkata ebe ya na ndị ọrụ ahụike nọ ebe ahụ gwara m na m ga-adị mma ma ọ bụrụ na e wepụ m appendisi chara acha n'afọ m."

"Di m gwakwara m ka m ghara ịkwa onye ọbụla."

Eziokwu agbala n'anwụ

Mgbe ọnwa ole na ole gachara, o bidoro rịawa ahụ, a kpọga ya n'aka dọkịta ezinaụlọ ya, nyocha e mere were gosi na akụrụ nke aka ekpe ya na-efu efu.

Nyocha ọzọ e mere gosikwara otu ihe ahụ.

Rita Sarkar kwara Hindustan Times sị, "Mgbe ahụ ka m matara ihe mere di m jiri sị m agwala onye ọbụla na a wara m afọ."

"O lere akụrụ m n'ihi na ezinaụlọ m akwụnwughị ụgwọ isi ọ nara."

Ụlọakụkọ Telegraph India kwuru na onyeisi ndị uweojii bụ Udayshankar Ghosh sị: "Anyị na-eche na ọ bụ a na-eche na ọ bụ mpụ agbakọ aka eme."

" Anyị nwetara ikpe gbasara iwepụ akụkụ ahụ. Anyị kpụpụla mmadụ atọ ụlọikpe maka igbu mmadụ ya na ita nwunye ahụhụ."