Ndị Bishọp ụka Katọlik: Ị gbara nkịtị ewu mụọ n'ọgbụrị

Ndị Bishọp ụka Kathọlik Image copyright @NGRPresident
Nkenke aha onyonyo Obi adị ndị Bishọp ụka Kathọlik mwute maka oke ọbara a na-akwafu na Naijiria

Ọgbakọ ndị Bishọp ụka Katọlik a kpọrọ 'Catholic Bishop Conference of Nigeria' na bekee kwupụtara nke a oge ha gara hụ onyeisiala Naijiria bụ Mohammadu Buhari n'obi ọrụ ya dị na Aso Rock, Abuja.

Ndị Bishọp ndị a nke onye ndu ha bụ Achịbishọp nke Jos bụ Ignatius Kaigama, kwuru n'akwụkwọ ozi ha gụpụtara n'ije ahụ sị na ọ bụrụ na ha gba nkịtị na amaghị-eme nke gọọmenti etiti, ọ bụrụ na ha akụọla afọ n'ala n'ọrụ ha dịka ndị nna nke okwukwe.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Archibshọp Ignatius Kaigama duru ndí ogbo ya ga ije ahụ

N'ihe gbasara nchekwa obodo, ha tara Buhari ụta sị na ọ gbara nkiti ewu amụọ na ọgbụrị.

Ha sịrị:" Obi dị anyị mwute na e gbuola ọtụtụ ndị mmadụ bi na mpaghara dị icheiche n'ala anyị ma laa akụ ha n'iyi. Akụ na ụba ruru nde kwuru nde naira, gunyere ụlọụka,ụlọakwụkwọ,ụlọọgwụ, na ebe a na-azụ ahịa bụcha ihe a gbara ọkụ.

"Ihe kacha ewute anyị bụ ọgbụgbụ ndị oyiegwu na-egbu igwe ndị mmadụ na Benue, Adamawa, Kaduna na Taraba steeti nke bụtere oke mkpu akwa na arịrị ọra mmadụ. Nkịtị gọọmentị etiti gbara ka nke a na-eme bụ ihe dị mgbagwoju anya."

Na ọchịchị na nchekwa akụ na ụba ala Naijiria, ha sịrị na Buhari na-akpa ọke.

Ihe Buhari kwuru

Mana na ọsịsa ya, onyeisi ala gwara ha na onweghị agbụrụ maọbụ mpaghara ọchịchị obodo ama ụma megbue na ike ọrụ gọọmenti.

O kwekwara nkwa na ya ga-enyochagharị ọrụ ndị gọọmenti nyere iji mezie ya.