Ụlọikpe enyela iwu ka anwụchie Innoson

Ebe foto si, @InnosonMotors
Innocent Chukwuma
Jọstis Mojisola Dada nyere iwu ka anwụchie Chukwuma ma kpụta ya n'ụlọikpe ụbọchị anọ nke ọnwa March.
Cornel Osigwe bụ ọnụ n'ekwuru Innoson group kwuru nkea na-mkpakọrịta uka ya na ndị BBC.
A na-ebo Chukwuma na o hiri asaa na anya jụ ị za oku ụlọikpe kpọrọ ya tata bụ Afọ 9/2/18.
Mana Cornel Osigwe siri na ụlọikpe e nyeghị Chukwuma akwụkwọ ị bia za oku ahụ. Dika o siri kwuo, ọ bụ na-asịrị ka ndị ọkaikpe ya nuru ya bụ oku were si ka ha bia mara ma ọ bụ eziokwu.
Ndị ọkaikpe Chukwuma kọwatara ụlọikpe na ọ nweghị ha ji nwete akwụkwọ ya bụ oku. Mana Jọstis Mojisola Dada na-ahu maka ya be ikpe gara n'ihu si ka anọrọ n'ụlọike ahụ nye nay akwụkwọ oku ọzo.
Ndị ọkaikpe Chukwuma yọro ụlọike ka ha zitere ya akwụkwọ oku dika iwu obodo siri kwuo karia ị nye ya akwụkọ n'ihu ụlọikpe.
Dika Cornel Osigwe siri kwuo, ọ sịrị na ya na-enyo na aka enwe dị na ya bụ ofe.
Ka ọ dị ugbua, Ndị ọkaikpe Innoson Chukwuma a gala ị hụ ịkpesara ụlọikpe nke Appeal ka ọ nyere ha aka mee ka e zitara Chukwuma akwụkwọ oku dịka iwu obodo siri kwụo.
Na ọnụ okwu ya " Innoson bụ o ji ego acho ego a maama, ọ naghị atụegwu ị za ụloikpe oku".