Chris Elisha na ọdịnihụ ya

Chris Elisha Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chris Elisha ga-ama ọdịnihụ taa

N'ụbọchị nkwọ bụ abalị isii n'ọnwa Jenụwarị ndị uwe oji jidere otu nwoke bụ onye ọka ikpe adịgboroja aha ya bụ Chris Elisha.

Ekwuola na nwoke a ga ba ụlọ ikpe taa, zakwa ajụjụ maka njọ ya.

Ihe butere ya

Otu ọka ikpe bụkwa onye ọkachamara ihe gbasara iwu ala bụ Emeka Eze gwara BBC igbo na ihe a mere ka ụlọikpe di na Naijiria dizia ka ebe a na-azụ ahịa.

"Anagha arụzị ọrụ ndị ọka ikpe etu esi arụ ya. Ndị 'charge and bail' bụ ndị na-agagharị na Magistrate Court. Ihe a emebiela aha ndị oka ikpe. Ọ dị zị ka 'ochanja market'. Ihe a bụ ihe mere ka ndị dika Elisha n batanwuo n'ụlọ ikpe anyị," Eze kwuru.

Gịnị ga-akwụsị ụdịlị ihe a?

Eze kwuru na onweghị onye na-ajụ onye ọbụla ko wete akwụkwọ ya. Ihe bụ ihe na-ebute ndị adịgboroja.

"Otu ndi oka iwu na Naịjirịa na Ụlọ ikpe nke kachasị kwesịrị i zipu aha ndị oka ikpe na foto ha gawa steeti niile. Steeti ezipuzie ha gawa ụlọ ikpe niile. Sọọsọ omume nkea ga akwụsị ndị adịgboroja n'ụlọ ikpe anyi," Eze kwuru.

Elisha na ọdịnihụ ya

Elisha n'ọkwa na nnukwu nsogbu maka njọ ya. Eze kwuru na "ndi uweojii ga-ebo ya ebubu ikọrọ mmadụ dika onye oka ikpe. Nke a ga-enwe ike i bute mkpọrọ afọ asaa."

Ọ bụ onye okaikpe Nnmadi Nwafor bụ onye mebọrọ Chris Elisha na Ojo Magistrate Court.