Winter Olympics 2018: Naijiria na ala asaa ndị ọzọ ga-eso

Nigeria women bobsleigh team Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndi otu bobsled umunwanyi ala Naijiria bu otu nke mbu si na Afrika sokwa na Winta Olympics

Ala asatọ na mba Afrika ga-eso na egwuregwu Winter Olympics nke afọ 2018 ga-eme n'ime ala South Korea.

Maka na ala Afrika dị ezigbo ọkụ, obodo si Afrịka anaghị eso n'egwuregwu dị ichiche dika Skiing, Bobsled na Snowboarding.

Mana ọtụtụ ndị egwuregwu sị na Naijiria, Eritrea, Ghana, Kenya, Madagascar, South Africa, Morocco na Togo ga-eso n'asọmpi nke a na Pyeongchang.

Ihe a bụ mbụ ala ndị dịka Nigeria na Eritrea, na-eso n'asọmpi nke a.

Lekwa anya ka ị hụ uzọ i ga-esi hụ ndị egwuregwu mba Afrika ga-eso na Winta Olimpiks. Metụ foto ha aka ka ị mara ihe dị icheiche gbasara ha niile:

  • Akwasi Frimpong

    • Afọ: Iri atọ na otu (31)
    • Mba: Ghana
    • Egwuregwu: Skeleton

    Akwasi Frimpong malitere otu Bobsled na Skeleton Federation nke Ghana (BSF-Ghana) n’afọ 2016.  

    Frimpong na-agbabu ọsọ mana ahụ ọmerụrụ n’ụkwụ mere ya ka o bido mewe egwuregwu ọzọ. 

    Ọ na-ewe ihe ruru afọ anọ na isii iji bụrụ onye nwereike ịsọmpi ọfụma ma mụta egwuregwu a, maka na ọ na-aga ọsọọsọ nke ga-eme ka ọ raa ụbụrụ gị ahụ ichukwute ya
  • Sabrina Simader

    • Afọ: Iri na itoolu (19)
    • Mba: Kenya
    • Egwuregwu: Alpine Skiing

    Simader onye ezinaụlọ ya kwagara mba Austrịa oge ọ dị nanị afọ atọ, bụ onye mbụ ga-anọchite anya Kenya na wịnta olimpiks.  

    N’afọ 2016, ọnọchitere anya ndị mba East Africa na wịnta olimpiks nke ndị ntorobịa emere na Norway. 

    Ọdịrị mmetụta na-eso ịnọ n’elu ski, ịgasi ọdịrị ike ahụ, ọ dịka ikopula. Ahụ a na-akpalite gị, ọ dị ka i nwerela onwe gị. Ọ bụ oge gị
  • Mialitiana Clerc

    • Afọ: Iri na isii (16)
    • Mba: Madagascar
    • Egwuregwu: Alpine Skiing

    Mialitiana Clerc mụtara etu esi eme ski oge ọ dị afọ atọ, na mba France. Ọ gbara afọ iri na isii n’ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba 2016, nke mere o ji bụrụ otu n’ime ndị kachasị na nwata n’asọmpi a. 

  • Samir Azzimani

    • Afọ: Iri anọ (40)
    • Mba: Morocco
    • Egwuregwu: Cross-Country Skiing

    Samir Azzimani asọbuola mpi alpine skiing tupu ọ gafee cross-country skiing. 

  • Adam Lamhamedi

    • Afọ: Iri abụọ na abụọ (22)
    • Mba: Morocco
    • Egwuregwu: Alpine Skiing

    Adam Lamhamedi bụ onye nwere agbụrụ na Morocco na Canada, mere ihe a na-agaghị echefu echefu oge ọ bụ onye Africa mbụ nwetere ihe nrite ọlaedo na wịnta olimpiks ndị ntorobịa emere na Austria n’afọ 2012. 

  • Moriam Seun Adigun

    • Afọ: Iri atọ na otu (31)
    • Mba: Nigeria
    • Egwuregwu: Bobsleigh

    Seun Adigun malitere otu Bobsleigh mbụ nke Nigeria. Ọ bụ ọkwọụgbọ nke otu Nigeria.   

    Ọ nọchiburu anya Nigeria n’ịgbaọsọ 100m hurdles n’asọmpi sọma olimpiks emere n’London n’afọ 2012. 

    Ọ dị egwu... Enwetubeghị onye nọchitere anya Nigeria na wịnta olimpiks ya mere o ji eme ha obi ụtọ ịhụ ka ọ na-emezu.
  • Akuoma Omeoga

    • Afọ: Iri abuọ na ise(25)
    • Mba: Nigeria
    • Egwuregwu: Bobsleigh

    Akuoma bụ onye ‘brakewoman’ nke otu bobsleigh Nigeria nke mbụ. 

    Ọ na-arụkwa n’ebe a na-ewe n’ọrụ n’ihe gbasara ahụike. 

  • Ngozi Onwumere

    • Afọ: Iri abụọ na isii (26)
    • Mba: Nigeria
    • Egwuregwu: Bobsleigh

    Ngozi Onwumere bụ ọgbaọsọ nọchiteburu anya Nigeria na egwuregwu ‘all African games’ emere na 2015. 

  • Simidele Adeagbo

    • Afọ: Iri atọ na isii (36)
    • Mba: Nigeria
    • Egwuregwu: Skeleton

    Ka ọ rụchara afọ itoolu ọ hapụrụ asọmpi nke egwuregwu, Simidele Adeagbo nwetere mbuteuche n’aka ndị otu bobsleigh Nigeria wee kpebie ịbụ onye asọmpi skeleton.  

    Adeagbo bụ onye mbụ ga-esi Nigeria asọmpị egwuregwu a na wịnta olimpiks. 

  • Connor Wilson

    • Afọ: Iri abụọ na otu(21)
    • Mba: South Africa 
    • Egwuregwu: Alpine skiing

    Connor Wilson gụrụ akwụkwọ ịbụ dọkịta na-elekọta ụmụanụmanụ na Mahadum nke Vermont dị na mba America. 

  • Mathilde-Amivi Petitjean

    • Afọ: Iri abụọ na atọ (23)
    • Mba: Togo
    • Egwuregwu: Cross-Country Skiing

    Mathilde-Amivi Petitjean bụbụ onye otu cross-country ski nta nke ndị mba France tupu ọ gafee ma bido ịnọchite anya Togo, mba ebe amụrụ ya. 

  • Alessia Afi Dipol

    • Afọ: Iri abụọ na abụọ (22)
    • Mba: Togo
    • Egwuregwu: Alpine Skiing

    N’agbanyeghị na onweghị agbụrụ jikọrọ ya na Togo, Alessia Afi Dipol bụ onye amụrụ ma zụọ na mba Italy, họrọla ịnọchite anya mba West Africa a.  

    Ọ bu ụzọ nọchite anya Togo n’asọmpi egwuregwu a oge emere wịnta olimpiks n’Sochi n’afọ 2014. 

  • Shannon-Ogbani Abeda

    • Afọ: Iri abụọ na otu (21) 
    • Mba: Eritrea
    • Egwuregwu: Alpine skiing

    Abeda toro na Canada ma chọbuo ịbụ onye egwuregwu họkị, mana nne na nna ya chere na ime ski ga-akara ya mma.  

    Ọ bụ onye mbụ ga-anọchite anya Eritrea na winta olimpiks. 

    Amam na ọ bụghị ihe na-eme oge ọbụla na onye dịka m si Eritrea nwereike ịbụ onye na-eme ski, mana ndị Eritrea ma etu esi ahụ mba ha n’anya. Ha hụ onye na-anọchite Eritrea n’anya ọma, ọ na-eme ha obi aṅụrị 

Ebe e si nweta foto:

Matthias Hangst/Getty Images, Dimitar Dilkoff/AFP/Getty Images, Francois Xavier Marit/AFP/Getty Images, Shaun Botterill/Getty Images, Christophe Pallot/Agence Zoom/Getty Images, Alexander Hassenstein/Getty Images, ALEXANDER KLEIN/AFP/Getty Images, Dean Mouhtaropoulos/Getty Images, Courtney Hoffos

Isiokwu Ndị Emetụtara