Arsenal na Tottenham: Asọmpị nke ndi dike

Ebe foto si, Getty Images
Lucas Moura bụ onye ọhụrụ otu Tottenham nwere ike ị so na asọmpi nke a
Arsenal na Tottenham ga-asọmpi echi n'ọgba egwuregwu nke Webley.
Ugbu a Arsenal na-akwado ị ga Wembley maka asọmpị iko Premier League.
N'okpokoro na-egosi pointi, Arsenal ji pointi anọ nwe karị Tottenham.
Arsenal nọkwa na ọnọdụ nke isi.
Ndị hụrụ Arsenal n'anya, na-atu egwu maka onye nche bọọlụ bụ Petr Cech nwere ike anaghị eso na asọmpi nke a maka o merụ arụ ụkwụ.
Onye nkwụzị ndị Tottenham bụ Mauricio Pochettino ekwuola "A bụ m onye na-ekweta na ihe di mma ga-eme. Asọmpi nke a ga esị ike"
Arsene Wenger bụ onye nkwuzi otu Arsenal kwuru na "Ị le anya n'okpokoro, ị ga-ahụ na asọmpi nke a di ezigbo mkpa ị nwe mmeri"
Asọmpi nke a ga-eme na elekere abụọ na ọkara n'ehihe nke echi na oge anyi na Naijiria.