North Korea akpọọla South Korea bia ọgbakọ gbasara udo

Kim Yo-jong na Moon Jae-in Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Kim Yo-jong nyere onyeisi ala South Korea bụ Moon Jae-in akwụkwọ ozi nke Kim Jong-un

Onyeisi ala North Korea bụ Kim Jong-un akpọọla onye isi ala South Korea bụ Moon Jae-in bia ọgbakọ na Pyongyang.

Nke a bụ ọgbakọ nke mbụ ga-eme na-etiti ha abụọ n'afọ iri.

Moon kwuru na mba abụọ ahụ kwesịrị ịhụ na ọgbakọ nke a, ma rịọ kwa ndị North Korea ka ha laghachi na mkparịtaụka gbasara udo na ndị Amerika maka iweta udo.

Ọ bụ nwanne Kim Jong-un nwaanyị bụ Kim Yo-jong bụ onye wetara akwụkwọ ozi nke a.

Gini ka ndị US chere maka ihe a?

Ndị mba US adọọla ndị South Korea aka na ntị maka ọgbakọ nke a.

Onye isi ala Amerika bụ Donald Trump na-atụ egwu maka South Korea nwere ike ikweta na omume North Korea na ogbunigwe a na-atụ.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Kim na Pence n'ụbọchị nke mbu na Winter Olympics 2018

Ihe South Korea chọrọ

Onye isi ala South Korea bụ Moon Jae-in kwuru na ala ha na North Korea kwesịrị ihu na ọnọdụ di mma tupu ha bido ọgbakọ nke a.

Moon kwuru na ala ha mara na ọgbakọ nke a di ezigbo mkpa.

Ma kwukwa na achọ ka udo di na egwuregwu winter olympics na-eme ugbua na ala ha.

Onye bu Kim Yo-jong?

Kim Yo-jong bụ nwanne nwanyi onye isi ala North Korea Kim Jong-un. Akụkọ ala kwukwara na ya na Kim dị na mma.

Ọ bụ afọ nke garaga ka onye isi ala North Korea kweta na nwane ya ga-abụ ọnụ ga-ekwuchite n'ihe gbasara ọgbakọ ala ha na South Korea.