Boko Haram: Ndị nkuzi abụọ, ụmụ nwanyị iri apụọla n'aka ha

Soldiers Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọtutụ afọ agaala ndị agha ala Naijịrịa na-aluso ndị Boko Haram ọgụ

Boko Haram ahapụọla mmadụ atọ bụ ndị nkuzi mahadum nke Maiduguri.

Ndị ọzọ Boko Haram hapụrụ bụ ụmụ nwanyị iri ajidere na Damboa na Bornu Steetị.

Ndị na-ahụ maka nche ala Naijịrịa nke puriche akpọrọ Department of State Services n'olu bekee kwuru nke a n'akwụkwọ ozi e zigara ndị nta akụkọ.

Ha dere na ndị otu Red Cross tịnyere ọnụ na yabụ okwu bụ ihe meka Boko Haram hapụ ndị a ajidere.

DSS kwuru na ha na-eburu ndị a sị na-aka Boko Haram puta gawa Abuja.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ n'ime ndị ụmụ agbọrọbịa Chibok nọkwa n'aka ndị Boko Haram

Ha kwukwara na ndị agha ala Naijịrịa ga-eche ha nche.

Ugbu a, ndị dibia bekee di iche iche na eche ha na Abuja.

Na yabụ akwụkwọ ozi, onye isi ala Mohammadu Buhari kele onye ọbụla gbara mbọ hụ na ndị Boko Haram hapụrụ ndi ajidere.

Buhari kwukwara na ọ dị ezigbo mkpa ka ha chọpụta ndị umu agbọrọbịa Chibok nọkwa n'aka Boko Haram.

Onye isi ndị DSS bụ Lawal Daura kweta nkwa na ndị ọrụ ya ga achọputa ha niile.