Lassa Fever: Otu awụọla, mmadụ iri abụọ na otu nọ n'ụloọgwụ

Garri Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anambra steetị butere iwu machiri ịṅụ garri na steeti ha

Ọrịa lassa egbuola otu onye na Taraba steeti.

Dokịnta Aketemo Udi bụ onye akpọrọ 'Epidemiologist' n'olu bekee gwara ndị ntaakụkọ na ọbụghị mmadụ atọ nwụrụ dịka ụfọdụ ntaakụkọ dere.

Udi kwuru na ọ bụ ọrịa ọzọ gburu mmadụ abụọ n'ụbọchị ole na ole garaga.

"Ugbu a, mmadụ iri abụọ na otu bụ ndị na-eme ka ha nwere ọrịa lassa. Mana sọọsọ mmadụ ise ka anyị ma nwere lassa n'ime ha. Otu n'ime ha awụọla. Ugbu a, anyi na-eche akwụkwọ ga-egosi ma mmadụ asatọ ọzọ o nwere ọrịa lassa."

Udi kwuru na sọọsọ ebe akpọrọ 'laboratory' n'olu bekee ga-enweike inyocha ma ọrịa ọbụla mọọbụ lassa, maka na oyiri ọrịa ndị ọzọ dịka Dengue fever na Yellow fever, Udi kwuru.

Steeti ndị nwere Lassa

Kemgbe afọ 2018, Naijirịa enweela ọrịa lassa ruru ihe dịka otu narị na asatọ.

Ọria nke a abaala steeti dika Edo, Ondo, Bauchi, Nasarawa, Ebonyi, Anambra, Benue, Kogi, Imo, Lagos na Taraba.

Ndị na-arụ n'ụlọọgwụ ruru ihe dika mmadụ iri na steeti anọ Ebonyi, Nasarawa, Kogi na Benue nwere lassa.