Mmadụ 104 n'Enugu North abụrụla ndi enweghị ọrụ

Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ụgwuanyị Image copyright Enugu State Government
Nkenke aha onyonyo Ugwuanyi bụ onye pati PDP, nke nọbụ n'ọchịchị na Naịjirịa

Onye na-achị Enugwu steeti bụ Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi chụrụ mmadụ 104 na-arụrụ ya ọrụ ka ihe bekee kpọrọ 'Executive Assistant', maka ha arụghị ọrụ ha etu ha kwesịrị.

Ugwuanyi, ka ọ na-ekwu maka ọchụchụ a ọ chụrụ ndị a, sị na ndị ọru, ọkachasị ndị si ebe a na-akpọ 'Enugu North Senatorial District', gbara ndebanye aha maka mbinye aka ndị na ahụ maka mbinye aka a na-kpọ INEC mere nkịtị.

Ndị 'Executive Assistants' a si na ward 104 dị na Enugu North.

Ugwuanyi sị ka ha ncha laghachị ward ha ga weta nkwado tupu ewegharịa ha n'ọrụ.

Na ime ya, Gọvanọ Ugwuanyi sị na obi adighi ya mma etu ndị bụ bụ EA jiri hapụ ịhụ na ndị mmadụ mara maka ihe gọọmentị na eme, ọkachasi etu o siri metụta ndị nọ n'ime obodo.

Ọ sikwa ka ndị ọnụ na-atụ nkụ na pati nakwa ihe banyere gọọmentị na-ahọpụta ndị nwere okwukwe ma achọwa ndị ga-agara obodo ozi na ward di icheiche.