Ndị uweojii anọ n'ime ndị 'ọchụehị wakporo' efuola

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi
Ndị uweojii na Benue steetị na-akọwa na ndị otu ha anọ na-efu efu kemgbe ndị ha na-eche na ha bụ ndị ọchụehi wakpochara ha ka ha nọ n'ọrụ nchekwa.
Onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Benue bụ Moses Yamu, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha wepụtara maka ndị ntaakụkọ.
Ọ sị na ọ nọ na Logo, bụ mpaghara ime obodo steeti ahụ ọgbaghara na-eme ka ihe a mere.
Ọ si, "Ka anyị na-eme ngagharị iji gosi na anyị na-echekwa obodo etu o siri masị, ndị otu ọrụ anyị a na-kpo 'Police Mobile Force Team' gara Ayilamo nke dị na Logo LGA. Mana, ka ha na-alọta ebe ha na anọ, ndị ọchụehi bu egbe wakporo ha. Otu n'ime ụgbọala ha ji arụ ọrụ gbara ọkụ ka mwakpo a na-eme."
Cheta na ndị ọkọụgbo na ndị ọchụehi na Benue steeti nwere nsogbu, nke butere igbu mmadụ na imebi akụnụba dị icheiche.