Asọmpi ịgba mgba Afịrịka ga-agwụ taa

African Wrestling Championship na Port Harcourt

Ebe foto si, Emeka Dennar

Nkọwa foto,

Ukoro Peter ji ọlaedo kpọọ Nigeria ihuọma n'ụbọchị mbụ nke African Wrestling Championship

Kemgbe izuụka gara aga, Port Harcourt, bụ isi obodo Rivers steeti, nabatara ndị egwuregwu mgba si mba Afịrịka iri na itoolu, ndị biara maka egwuregwu akpọrọ African Wrestling Championships.

Mba ndị bịara asọmpi a bụ Egypt, Morocco, Guinea-Bissau, Tunisia, Algeria, Namibia, Kenya, Burundi, Senegal, Ghana, Uganda, Sierra Leone, Central Africa Republic, Madagascar na Nigeria.

Ndị mgba Naịjirịa so asọmpi n'egwuregwu a dị mmadụ iri itoolu n'oke dị icheiche.

Ugbua, Naịjirịa enwetala ihe nrite iri anọ na isii.

Ha nwetara ọlaedo iri na isii, ọlaọcha iri na anọ na ọlanchara iri na isii nke mere ha jiri bụrụ ndi mbụ n'ọkwa n'asompi a.

Odunayo Adekoroye na African Wrestling Championship

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi mpaghara na-ahụ maka mgba na Nigerian Wrestling Federation (NWF) bụ Daniel Igali, nyere onye na-achị Rivers steeti bụ Nyesom Wike ekele maka nkwado o nyere ndị mgba Naịjirịa na etu o siri hazie asompi a.

A na-ele anya na Naịjirịa ga-anọ n'isi ndị kacha nweta ihe nrite mgbe asọmpi a ga-agwụ taa bụ Febrụwarị 11.