Newcastle emeriela Man United n'iko Premier League

Matt Ritchie Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Matt Ritchie mgbe o nyere goolu ya

Newcastle emeriela Manchester United n'asọmpị iko Premier League nke agbara na Sunday.

Nke a bụ nke mbụ Newcastle merịrị Man United ke mgbe ọnwa Ọkụtoba nke afọ 2017.

Matt Ritchie onye otu Newcastle bụ onye nyere otu goolu n'asọmpi nke a.

Nke a emeela ka ha pụọ na 'relegation'.

Dike na dimkpa ọhụrụ Newcastle

Ugbua, onweghị maachị ọbụla Man United merịrị n'asọmpị Premier League n'afọ nke a.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Martin Dubravka sị Sparta Prague bata Newcastle

Onye nche bọọlụ ọhụrụ nke otu Newcastle bụ Martin Dubravka bụ onye gbarambọ hụ na Man United enyeghị goolu ọbụla.

O nwere olileanya?

Maka ihe a mere, Man United, ọ dịzịka Manchester City ga-abụ otu ndị mmerị iko Premier League afọ nke a.

Mana tupu ha aṅụrịwa, ha kwesịrị ị merị Manchester United na asọmpị ga-eme na stadiọmụ Etihad n'ụbọchị asaa n'ọnwa April (7-4-18).

Abụ mmeri Newcastle

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Matt Ritchie bụ onye ala Scotland

Onye nkuzi Manchester United bụ Jose Mourinho kwuru na ndị Newcastle lụrụ ọgụ dika ndị anumaanụ n'egwuruegwu taa.

Onye nkuzi Newcastle bụ Rafael Benitez nwere olileanya na nbinye aka n'akwụkwọ ha na Islam Slimani mere ga-ebute mmerị di iche iche n'odinihu.