Achọtala mmadụ ano n'ime ndị uweojii na-efu na Benue steeti

Ndị uweoji Naịjiria Image copyright Getty/AFP

Ahụla ndị uweojii mmadụ abụọ ndị furuefu mgbe awakpochara ha na steeti Benue na enweghi mmerụ ahụ ọbụla.

Mmadụ abụọ ndị a so na ndị uweoji anọ etiri mkpu ọchịchọ ha mgbe otu ndị uweojii na arụ ọrụ jekwuru mwakpọ n'aka ndị echere bụ ndị ọchị ehi na obodo Logo n'ehihe Satọde.

Komishọna na ahụ maka ndị uweojii na Benue steetị bụ Fatai Owoseni ekwuola na ha na-enwe olileanya na a ga-ahụ ndị uweoji abụọ foro.

Ndị uweojii abụọ ndị a wuchiri n'ụlọ ndị uweojii dịna Ayilamo n'abali gara aga ebe ndị ụweoji na-agba mbọ ị chọta ndị ọzọ ka furuefu.

Onye uweojii ọzọ sọ ha nọ n'ụlọ anata ọgwụgwọ maka ahụ ọ merụrụ n'ịhị egbe ndị ahụ gbara ya oge a awakporo ha n'ime ọhia.

Akụkọ pụtara sị na ha sị ebe ha gara nzụkọ nkwalite mmụọ ha n'ọbere obodo tupu awakpo ha na obodo Tse Akpam dịketere Azege nso.

Isiokwu Ndị Emetụtara