Philomena Chieshe akwụsị la ọrụ n'ike maka mpụ ego

Ebe foto si, @JAMBHQ
Ngalaba n'ahụ maka mmerụaka ego ebidola nyocha okwu a
Onyeisi akụkọ na ngalaba JAMB bụ Fabian Benjamin kwuru n'akwụsị la Chieshe ọrụ nike n'ụlọ ọrụ ha nke Benue steeti.
Benjamin sị na ọ na-agabiga nyocha ugbua maka ị mata ihe mere ego ha etu ahụ. Ọ sị na Chieshe akọwaghị etu ego ha etu aha siri fue efu kama ọ si naọbụ agwọ noro yabụ ego.
Egọ furu efụ bụ ịhe eritelụ n'ọrụre 'scratch cards' nke ndị ụmụ akwụkwo ji elele ule tupu ha banye mahadum.
Ka nyocha ya na-aga n'iru, akụkọ O kwuru maka agwọ noro nde naịra ịrị atọ n'isii n'ewu ewu n'elu igwe okwu.
Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ a bidoro mgbe ndị na-ahụ maka egọ gara nyocha n'ụlọ ọrụ JAMB na steetị dị ịcheịche maka 'scratch cards' ndị a rere ere na ndị fọrọ.
Ndị a gbara Chieshe ajụjụ ọnụ mana ọ nweghị ịke ị kọwa ịhe mere ego ahụ, O were sị na ọbụ agwọ noro ya.
O mechara gbanwe kwa okwu ya sị na onye odibo ya nke nwaanyị na nwaanyị ọzọ gbakọrọ aka kọ ya ọgwụ ma site n'uzo ndị mmụọ nara kwa ya ego ahụ.