Boko Haram: Gọọmentị atụọla mmadụ 20 na mkpọrọ

Onye agha Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Naịjirịa no na-ebụso Boko Haram agha na ugwu mmalite anyanwu Naịjirịa

Ihe rụrụ mmadụ 20 bu ndị otu oyi ndụ egwu Boko Haram ga-aga mkpọrọ n'ime ọtụtụ ndị ekpere ikpe.

A mara ndị a ikpe n'ụlọịkpe ndị agha dịna Kainji nke Naịja Steetị bụ ebe a nọ kpe ikpe a.

Otu onye ngwọrọ ọrụ ya bụ inye aka tọrọ ụmụaka Chibok 200 na 2014 so n'ime ndị ga-aga ụlọ mkpọrọ afọ 15.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụ Chibok ndị atughapụrụ

Nke a bụ mbụ a na-ama onye aka sọ na ntọro ụmuakwụkwọ Chibok ikpe.

Ụlọikpe a tọhapụrụ mmadụ abụọ n'ime ndị a maka enweghi ihe a ga-eji ma ha ikpe.

Gọọmentị Naịjirịa si na ha ji ihe karịrị mmadụ puku 6 bu ndị eche na ha bu ndị Boko Haram na ebe di icheiche na Naijirịa.

Na Ọktoba 2017, ha tụrụ mmadụ 45 mkpọrọ afọ 31.