Champions League: Tottenham na Juventus agbaala abụọ abụọ

Gonzalo Higuain Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Gonzalo Higuain nyere goolu kacha ọsọ na asọmpị Champions League

Tottenham na Juventus agbaala abụọ abụọ na asọmpị iko Champions League ụnyahụ.

Mana Juventus bụ ndị mbụ nyere goolu abụọ, tupu Tottenham esi azụ nyekwa goolu abụọ nke a.

Gonzalo Higuain bụ onye jịrị penalty nye goolu abụọ na ọkara nke mbu.

Mana oge etebeghị tupu, Tottenham bido ị tụ Juventus n'anya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Harry Kane enyeela goolu asaa n'ime asọmpị Champions League n'afọ nke a

Harry Kane bụ onye mbu nyere goolu ndị otu Tottehnam na nkeji 35.

Na nkeji 37, Christian Erikson nyere goolu nke abụọ nke otu Tottenham.

Tottenham o ga-enwe mmeri?

Ugbua, onweghị onye merịrị Tottenham na asọmpị nke 13 ha gara na Champions League. Ha ka nọ n'asọmpị iko FA, bụrụkwa ndị na-achọ ị ba n'otu ndi anọ nke elu n'iko Premier League.

Onye nkwuzi Tottenham bụ Mauricio Pochettino kwuru na "Anyi kwesịrị ị nwe mmerị n'asọmpị nke a mana ndị otu m emeela nke oma"

Isiokwu Ndị Emetụtara