Ụkọchukwu n'Enugu na-ahazị nzukọ mekọahụ n'ụlọụka ya

Vincent Nzeakor na'ụlọuka ya Image copyright Vincent Nzeakor
Nkenke aha onyonyo Vincent Nzeakor bu ụkọchukwu na'ụlọuka Wordcity Assembly di n'Enugu.

Ihe n'ewu na nta akụkọ ọhụrụ a na-akpọ social media bụ ihe ụlọụka dị n'Enugu na-akwado ime na 18 Febụwarị.

Ụlọụka akpọrọ Wordcity Assembly, nke ụkọchukwu Vincent Nzeakọr bu onye ndụ ha na akwado ime nnukwu nzukọ ebe ha ga ekwu okwu banyere mekọrịta nwoke na nwaanyi.

Ihe mere ihe a jiri tụọ ndị mmadụ n'anya bụ maka okwu mmekorita nwoke na nwaanyi bụ ihe anaghị ekwusi ike. Ma na ụka, ma na ezinụlọ, okwu mmekọrịta nwoke na nwaanyi abughị ihe ndị ala anyị na ekwụsị ike.

BBC Igbo gbara Nzeakọr ajụjụ maka nke a, o kwuru si na ihe ha na-eme bụ ihe ziri ezi maka o si na akwụkwọ nso ndị ụka bia.

Gee nu ya ntị ebe a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionVincent Nzeakor kwuru maka nzukọ mekọrịta nwoke na nwaanyị ọ ga eme

Nzeakor na-akọwa na ya mara iwu banyere nzukọ a ụka ya ga eme, sị na ọ bụ sọọnsọ ndị mebụrụ alụm di na nwụnye na ndị rụrụ afọ 25 ka a ga anabata.

Nzeakor kwuru, "Ị ma, ndị mmadụ na ekwu na okenya na-ebido na afọ 18, mana ekweghị m na nke ahụ, ọkacha na ụdịrị nzụkọ a anyị ga-eme. Ya mere anyi jiri tinye ya etu a. Ka anyi mara na onye ọbụla na abịa abụrụla ezigbo okenya."

Ọ gara n'ihu gwa BBC na etu a na-asi na ụka ekwesịghị ịtinye ọnụ na ihe gbasara mekọrịta nwoke na nwaanyị so n'ihe bụ nsogbu uka sikwa na "ọ ya na ebute mpụ na ajọ ihe ndị ọzọ".

Ge ya ntị ebe a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤkọchukwu kwuru okwu maka mekọrịta

BBC Igbo gara n'iru jụọ ya ebe o si weta ikike o ji na eme ụrịri nzụkọ a, o wee sị na o na akwụkwọ nsọ.

Na Facebook, ndị mmadụ na eti mkpu maka ihe a.

O nwere ndị na-akọwakwa na-ọbụghị so Nzeakọr na eme ụdiri nzụkọ a, ma na enyekwa atụ, dika nke di na ala:

Image copyright Jekwu Ozoemene/ Facebook
Image copyright Jekwu Ozoemene/Facebook

Nzeakor na onwe ya si na ya kwusi ike na ikike ọ sị n'akwụkwọ nsọ nyere ya.

Image copyright Vincent Nzeakor/Facebook

Isiokwu Ndị Emetụtara