Tsvangirai onye ndu na-ama Gọọmenti na-achị na mba Zimbabwe anwụọla

Morgan Tsvangirai gbasoro Robert Mugabe mgba dị ekwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị Zimbabwe Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Morgan Tsvangirai gbasoro Robert Mugabe mgba dị ekwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị nke Zimbabwe

Onye ndu na-ama Gọọmenti na-achị na mba Zimbabwe anwụọla n'afọ 65 na mba South Africa dịka ndịisi pati ya kwuru.

Tsvangirai bụ onye bụ buru onye prịam mịnịsta nọ n'ute ọrịa Kansa;

"Ọ nwụrụ n'abalị a. Ezinụlọ ya gwara m" osote onyeisi otu MDC bụ Elias Muduzuri gwara ndị Reuters.

Oge ọrụ Tsvangirai jupụtara n'agha ndọrọndọrọ ọchịchị mmegide onye bụ bụrụ onyeisi bụ Robert Mugabe.

Akụrụ ya ihe ma tụọ ya mkpọrọ ọtụtụ oge.

Tsvangirai chọpụtara otu Movement for Democratic Change (MDC) n'afọ 2000 nke megidere ọchịchị Mugabe.

N'afọ 2008 emere ntuliaka, Tsvangirai nwetara mbinyeaka karịchara n'agba nke mbụ mana o zughi inye ya mmeri.

Tupu agba nke abụọ nke ntuliaka ahụ ndị agha Mugabe busoro ndị otu Tsvangirai agha nke mere ka o wepụ aka ya n'ịzọ ọkwa ọchịchị ahụ,

E kwupụtara Mugabe dịka onye mmeriri na ntuliaka ahụ mana mkpụ ndị mba ọzọ tiri mere e jiri kee ọkwa ọchịchị mee Tsvangirai Praịm minista.

Tsvangirai zọrọ ọchịchị ọzọ megide Mugabe n'afọ 2013.

Otu MDC e kewala maka onye ga-abụ onye ndụ ha n'ịzọ ọkwa ọchịchị nke na-abịa n'afọ a mmegide ndị Zanu-PF nke onye ndụ ha bụ Emmerson Mnagagwa.

Isiokwu Ndị Emetụtara