Udọ jịkọrọ Oliseh na Fortuna Sittard adọbiela

Oliseh ebe ọ na-akuzi nkuzi egwuregwu bọọlụ Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Oliseh sonyere Fortuna Sittard ka onyenkuzi na Disemba afọ 2016

Sunday Oliseh bụ onye nkuzi otu bọọlụ Fortuna Sittard n'ala Nertherlands kwuru ụnyaahụ na ọ kwụsiri ọrụ n'otu bọọlụ ahụ.

Ọ sịrị na ihe e jirir chụọ ya n'ọrụ bụ na o kweghị ime ịhe megidere iwu n'otu ahu.

Fortuna Sittard kwukwara na Oliseh bụ onye n'enye mmadụ niile nsogbu n'orụ ya, na ọ bụ n'ihi nke a ka ha jịrị chụọ ya.

Ha nyere Claudio Braga bụ onyenkuzi otu nke ụmụaka ka onye ga-anọchịte anya tupu achọta onye ọzọ.

Cheta na n'ọnwa Jenụwari, Fortuna Sittard gọrọ agụgọ na ha achụghị Oliseh n'ọrụ.

Lee ihe Oliseh dere n'elu igweokwu Twita:

Fortuna Sittard kwuru nke ha kwa n'elu ya bụ igwe okwu Twitter:

Isiokwu Ndị Emetụtara