Don Waney: Ndị uweojii agbagbuola onye ntọ na Delta

Ndị uweojii Naijiria Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na-achọ ọtụtụ ndị ntọ ndị ọzọ

Ndị uweojii na Delta steeti egbuola otu onye a na-ebo ebubo na ọ bụ onye ntọ aha ya bụ Augustine Agulegbu.

Ha kwuru na Augustine Agulegbu bụ otu n'ime ndị otu Don Waney bụkwa onye ndị uweojii gbaburu n'ọnwa Janụwarị n'afọ nke a.

Ndị nche obodo pụrụiche bụ Department of State Services n'olu bekee kwuru na ha wakporo Agulegbu na New Sapela Road n'ime Delta steeti ebe a gbagburu ya.

DSS kwukwara na onye ọzọ ha na achọ ugbua bụ otu nwoke akpọrọ Emenike.

Emenike bụ otu n'ime ndị Gọvanọ Rochas Okorocha mmere mgbaghara.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Evans bụ onye ntọ mmadụ tọrọ ọtụtụ mmadụ

Nke a ọ ga-ebute udo?

Otu nwoke bi na Delta steeti aha ya bụ Ted Ugbovo gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ogbugbu ha gburu Augustine Agulegbunjọ enweghị ihe ọpụtara.

Ted kwuru: "Ndị uweojii na-egbu ndị ntọ mmadụ oge niile, mana ndị otu ha na-emechekwa mmalite ọrụ ha. Nke a bụ maka ọrụ adighị n'ala anyị."

O kwukwara na "Cheta na e ji Evans na Lagos, mana ọ kwụsịrị ntọ mmadụ? ihe ndị uwe ojii kwesịrị ime bụ ị kwalite nchekwube ndị mmadụ nwere n'ala Naijịrịa. Ọ bụghị ị me mkpọtụ na ha gburu otu onye ntọ"

Evans na ndị ntọ ndị ọzọ

Ugbu a, Evans na-aza ọnụ ya n'ụlọ ikpe n'Lagos.

O nwere ike ị ga nga ebebe maọbụ na ikpe maa ya.

DSS na-ekwe nkwa na ndị ntọ niile nọ n'ala Naijịria anaghị enwe ezumike.