Ipob: Tọhapụ ndị otu anyị

Nnamdi Kanu Image copyright NNamdi Kanu/ Facebook
Nkenke aha onyonyo Nnamdi Kanu bụ onye isi otu IPOB

Otu na-azọ maka ị nwere onwe ha bụ Indigenous People of Biafra na-etị mkpu ka gọọmentị ala Naijịrịa tọghapụ ndị otu ha e jịrị na mkpọrọ di iche iche n'ala Naijịrịa kpọm kwem.

Ipob kwuru ihe a n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Emma Powerful zipuru ndị ntaakụkọ.

Emma kwuru na ọbụrụ eziokwu na Ipob bụ ndị otu iyi egwu, anaghị aga ụlọ ikpebi nsogbu ha na gọọmentị ala Naijịrịa.

"Anyị bụ otu na-agbasa ozị udo. Ugbu a, gọọmentị anaghị ewepụta otu onye akaebe ga-ekwu na Ipob mere njọ niile ha kwuru na ha mere"

Emma jụrụ ajụjụ, "Onye bụ onye akaabe gọọmentị kwuru na onye isi anyi bụ Nnamdi Kanu na ndị otu anyị bụ Benjamin Madabugwu, David Nwawuisi, Chidiebere Onwudiwe na ọtụtụ otu IPOB gọọmentị jịrị na mkpọrọ di iche iche n'ala Naijịria?"

Image copyright STEFAN HEUNIS
Nkenke aha onyonyo IPOB na-ekwusi ike na ha bụghị otu iyi egwu

Emma kwuru na maka ihe a, ụlọ ikpe ala Naijịrịa abụọla ihe e ji achị ọchị n'ala ndị ọzọ.

Ke mgbe ọnwa Seputemba n'afọ 2017 ka ndị agha ala Naijịria nwapo bee Nnamdi Kanu n'Abia steeti.

Mana ugbu a, onweghị onye mara ebe Nnamdi Kanu nọrọ.

Ọ bụ n'ọnwa Jenuwarị ka ụlọ ikpe ala kpọrọ Ipob otu na-eyi egwu.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a