Falana: Gbasara Shekaụ, ndị agha anyị na-akọ ihe edeghị n'akwụkwọ

Ndị agha Naijiria Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mgbe Ndị agha turu ọnụ na ha anwụchiela Shekaụ ma ọ dị ndụ akpagharị

Falana bụ onye ọkaiwu ama ama na Naijiria sịrị na okwu ahụ ndị agha kwuru bụ ajambele.

Ụnyaahụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naijiria bụ Brigadier-General SK Usman kwuru n'akwụkwọ ozi o tinyere aka sị na onye ndu ndị Boko Haram bụ Abubakar Shekau, jikere yiri hijab dịka nwaanyị ma gbaa ọsọ.

Falana kwuru na ọbụghị ihe kwesịrị iji nti nụ na ndị agha na-ekwu na ha na-achọ Shekaụ maọbụ na ha achọbala inwụchi ya.

"O ruola ugboro iri ndị agha kwuru na ha egbuola ya. Ugbua, ha asị na ha hụrụ ya ebe ojikere ka nwaanyị na-agba ọsọ.

"Mgbe ha hụrụ ya ka o jikere ka nwaanyị na-agba ọsọ, gịnị mere na ha agbagbughị ya?"

O kwuru na ọ ga akara mma na ọ bụrụ na ha chọta ụzọ ịnwuchi ya tupu ha ekwu wa na ha chọrọ ijide ya.

Falana kwukwara na ụta adighirị gọọment na ọgbugbu mmadụ nile na-eme na Naijiria n'ihi na n'ụwa niile, onweghị ebe igbu mmadụ adịghị ugbua.

"Ihe dịrị gọọmenti bụ ịkpụpụha ụlọikpe ka ha ga zara ọnụ ha. onye ahụ ọ bụ onye nkịti , onye ndọrọndọrọ ma ọ bụ onye ọchị ehị."

O gara n'ihu kwue na ọ bụ maka na ọnweghị ihe e mere ndị gburu mmadụ oge gara aga ka ndị mmadụ ji aga n'ihu na-egbu ndị ọzọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara