Dibia bekee: Kwụsịnụ iṅụ akpụrụachịa

Mmanya ọkụ
Nkọwa foto,

Mmanya akpụrụachịa alala ọtụtụ ntorobia n'iyi

Ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ọ bụ mgbe ị ṅụrụ mmanya ọkụ karịa otu karama ka ị ga-adaba na nsogbu.

Mana ndị dibia bekee ekwuola na o nwere mmanya ọkụ na-ekwesịghị ịba mmadụ ọnụ.

Ufọdụ ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na aha a na-enye mmanya ọkụ a na-ere n'akụkụ ụzọ akpọrọ akụrụ akụ n'atọ ọchị.

Ha gụnyere akpụrụachịa, energy 2000, kerewa, fonofiri, kparaga, ogidiga, Ibile, baby ọkụ, Kogbebe, monkey shoulder, koboko, dadubule, apoko, gallant, pasa bitters, osomo, orimalu, nakwa durosoke.

pụtara na mmanya ọkụ adighị mma?

Otu dibia bekee akpọrọ Darlington Akahara, gwara BBC Igbo na mmanya ọkụ nwere oke ga abụ ị ṅụọ ya o dozie ahụ, oke ahụ bụ pasentị abụọ na ọkara.

Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ gbaara ụmụ mmanya ọkụ akpọrọ akpụrụachịa ọsọ, maka na ngwongwo dị na ya na-egbu umeji anụ.

Ọ kọwara ihe kpatara akpụrụachia ji dị njọ. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a.

Aha nkeananụānụ,

Dibia oyibo kọwapụtara maka mmanya ọkụ na otu osi dị njọ

Otu ihe si kwuru ụgbụa, ọ dị oke mkpa ka ndị isi oche leba anya na mgbalite mmanya ike nke gazugoro ala Naijirịa.

Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ akpọrọ NAFDAC ekwuola na pasentị iri asatọ mmanya ọkụ eji ahihia mepụta adịghị nma n'ahụ maka na ọ na-eripiasị ụfọdụ akụkụ ahụ mmadụ.