Jacob Zuma: Gọvanọ Okorocha ajụla ikutu akpụrụakpụ ya

Jacob Zuma Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Rochas gụkwara otu okporoụzọ dị n'Owerri aha Zuma

N'agbanyeghị na Jacob Zuma arituola n'oche ọchịchị mba South Africa, gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, ekwuola sị na ya agahị akutu akpụrụakpụ ya.

Ka ụbọchị abụọ gachara kemgbe Zuma si n'ọche ọchịchị rituo, ndị mmadụ bidoro ijụ ajụjụ ma Okorocha ọ ga-enye iwu ka akutuo akpụrụakpụ ya ọ kpụrụ n'afọ 2017.

Ndị mba South Africa na ndị otu pati Zuma bụ ANC gwara ya rituo maka ebubo mpụ na nrụrụaka eboro ya.

Ebubo a kpatara ụfọdụ ndị mmadụ ji cheta akpụrụakpụ a ma kwulite okwu ikutu ya.

Onye na-ekwuchitere Okorocha bụ Sam Onwuemeodo wepụtara akwụkwọ gọvanọ binyere, ebe ọ sị na agahị akutu akpụrakpụ Zuma.

Ọ sị "gbasara akpụrụakpụ Jacob Zuma n'Owerri na iritu n'ọchịchị ya dịka onyeisiala mba South Africa ụbọchị ole gara aga, agaghị akutu akpụrụakpụ a. Akpụrụ ya oge ọ ka bụ onyeisiala. Ka anyị tinye uchu n'akụkọ gbasara ndụ ya.

N'ịma atụ, otu nwoke na-agaghị akwụkwọ n'ụzọ ọbụla ma mechaa bụrụ onye aka ya dị na nwereonwe ndị obodo ya ma bụrụkwa onyeisiala otu n'ime mba na-edu mba Afịrịka ndị ọzọ, bụ ihe kwesịrị ime ka ndị mmadụ cheba echiche."

Ihe a Rochas kwuru ozuru iji ahapụ akpụrụakpụ Zuma ka ọ kwụrụ n'Imo steeti?

Isiokwu Ndị Emetụtara