Na South Africa, e merụla onye Nigeria ọzo ahụ

Ụmụ akwụ ndị Naijiria na-eme nghagharịiwe megịde igbu ndị naijiria na South Africa Image copyright Getty Images

E merụrụ nwaafọ Naijiria a kpọrọ Desmond, onye na-ere ihe isi, ahụ n'ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa Februwarị.

Dịka Adetola Olubajo, onyeisi otu ndị Naijiria bi South Africa siri gwa ndị ụlọ ntaakụkọ NAN, "A wakporo ya n'ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa Februwarị ma merụkwa ya ahụ. A zọpụtara ya mgbe ha na-achọ imụnye ya ọkụ ka ha gbasachara ya mmanụ ụgbọala."

Olubajo kwukwara na ndị Naijiria bi na mpaghara ahụ na-ebizi n'oke egwu.

O kwuru na ndị isi otu ha agala ebe ihe a mere iji mata ka o siri mee.

"Ndị Naijiria bị ebe ahụ kwuru na o nwere otu ndị na-atọrọ ndị Naijiria ma naa ha ụgwọ isi tupu ha atọrapụ ha. N'onwa gara aga, ha gburu otu onye akwụlighị ụgwọ isi ya. Ndị otu na-agakwa zuo ohi na ụlọ ahịa ndị Naijiria."

Olubajo, onye kwuru na ọ bụghị eziokwu na ndị Naijiria a na-egbu na South Africa bụ ndị omekome, rịọrọ ka gọọmenti Naijiria lebanye anya na nsogbu ahụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara