Ụmụakwụkwọ 50 efuola na mwakpo Yobe steeti

Ndị ụlọakwụkwọ na ndịnkuzi ha
Nkenke aha onyonyo Ndị nkuzi n'ụlọ akwụkwọ awakporo nọ na-achọ ndị ụlọawkwụkwọ ha

Gọomentị ndị Yobe steeti ekwuputala na a na-achọ ụmụakwụkwọ ruru 50 na Yobe steeti ka ndị bu egbe echere na ha bụ ndị Boko Haram wakporochara ụlọakwụkwo ha

Onye ntaakụkọ gwara BBC na-achọtala mmadụ iri n'ime ụmụakwụkwo ahụ gbara ọsọndụ ka aka na-achọ ndịọzọ n'ọhịa.

Ndị bu egbe zọbatara n'ime obodo ahụ ma gaba n'ụlọakwụkwọ sekondịrị ahụ. Mgbe ha ruru ọ bụrụ na ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nkuzi ha agbabala n'ime ọhịa.

Kemgbe ugbu a, a matabeghị ọnụọgụgụ ndị ka nọ n'ime ọhịa ebe ndị obodo Dapchi ebe nke a mere so achọ ụmụakwụkwọ a.

Cheta na ndị Boko Haram tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok 276 n'ụdị mwakpo yiri nke a na afọ 2014.

Ndị hụrụ mgbe ihe a mere sị na ndị a bu egbe bukwa ụgbọ agha ruru iri n'abụọ n'ọnụọgụgọ were bata obodo ha.

Ndị a malitekwara ịgba egbe ma na-atụkwa ogbunigwe n'ụzọ mwakpo.

Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ n'ime ndị ụlọakwụkwọ ahụ na Dapchi dịka ndị Chibok atọrọ n'afọ 2014

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a