Ndị otu Biafra chọrọ ka Naijiria dị mpaghara isii

Biafran Flag Image copyright Getty Images

Ndị ndu otu na-achọ mnwereonwe Biafra ekwuola ka e dogharia ala Naijiria nke a kpọrọ 'restructuring' na bekee ka ọ dị mpaghara isii nke ga-agbado ụkwụ n'iwu ala anyị nke afọ 1963.

Ndị otu a kwuru nke a n'ọgbakọ ha nwere na Nnewi, Anambra Steeti nsonso a.

Ha jụrụ atụmatụ ihapụ steeti iri atọ na isii e nwere dịka nkewa ọchịchị ala Naijiria, n'ihi na, dịka ha siri kwuo, o megidere ebumnuche ndị Biafra.

Ndị soro mee ọgbakọ ahụ pụrụ iche gụnyere otu MASSOB, Biafra United Liberation Council (BULCO),Igbo Hebrew Cultural Restoration na Eastern Peoples Congress (EPC).

N'akwụkwọ mgbasa ozi ha wepụtara nke Uchenna Madu (MASSOB), Felix Obioha (EPC) na Amadi Innocent tinyere aka n'aha ndị ọzọ, nke ha nyere ndị ntaakụkọ, ha nwere mkpebi ọtụtụ ihe metụtara mnwereonwe Biafra.

Ha kwuru na ha chọpụtara na ndị na-emegide ha n'ụlọ na n'ilo na-enwe ọṅụ mgbe ọbụla ndị otu ha na-eme onye-na-nke-ya, onye-na-nke-ya, ma kpebie na otu ndị na-agba mbọ nwereonwe Biafra ga-ebido mmekọrịta maka mmezu mnwereonwe Biafra.

Ha kwuru: "Ndị otu anyị nọ n'ụlọ ekpebiela na anyị na ndị nọ mba ndị ọzọ ga na-arụkọ maka ebumnuche ime ntuliaka referadum ga-amịta mkpụrụ maka mnwereonwe Biafra n'aka Naijiria."

Akụkọ ga-amasị gị: