Mmadu 3 na-eku mmanụ na gwongworo n'Ikorodu anwụola

Ebe foto si, AFP
Gwongworo bu mmanụ ụgbọala na adakarị na Naịjirịa
Ụmụnwoke atọ so na ndị nọ na-eku mmanụ nrị na-agbapụta na gwongworo daala n'Odogunyan bụ obodo di n'Ikorodu na Legos steeti nwụrụ, otu nwanyị merụrụ nnukwu ahụ.
Ihe mberede a mere na ụtụtụ ụnyahu ka gwongworo a dara ka o n'eru ebe a kpọrọ 'Sabo Garage' n'Ikorodu.
Ka ihe a mere, ndị mmadụ che na ọ bụ mmanụ ụgbọala ka gwongworo a bu gbagara ebe ahụ iku mmanụ.
Ọ ka ha no na-eku mmanụ ka isi gwongworo a dala sụgbụọ mmadụ atọ n'ime ha.
Ebe foto si, @tonypox
Otu nwoke na nwaanyị n'ime ndị a na-eku mmadụ merụrụ nnukwu ahu. Ha nọ zi na ụlọọgwụ 'general' na Ikorodu na-anata ọgwụggwọ.
Otu nwoke hụru ihe mberede a sị na mgbe gwongworo a dara, isi ha kopuru.
Onyeisi ndị gbata gbata na Legos bụ 'Lagos State Emergency Management Agency' (LASEMA), bụ Adesina Tiamiyu, sị na ha ma maka ihe mberede a, ma na-ariọ ndị na-anya ụgbọala ka ha na-akpachara anyị ma dobe iwu okporo ụzọ, ma yokwa ka ha n'enyocha ụgbọala ha tupu ha etinye isi n'ụzọ.