Joe Achuzia, onye agha Biafra anwụọla

Joe Achuzia
Nkenke aha onyonyo Joe Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970

Onye bụ otu onye ndị duru ndị agha Biafra n'agha Naịjiria anwụọla ka ọ gbara afọ ịrị itoolụ.

Joe Hannibal O.G. Achuzia nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị taa ebe elekere asatọ n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti n'Asaba.

Diọkpara ya bụ Onyeka Achuzia gwara ndị ntaakụkọ n'Asaba na ọ bụ obi tiwara etiwa ka ha jiri agbasa ozi a.

Nkenke aha onyonyo Ndị agha Biafra

"Nnam rịara ọrịa nwa ntakịrị oge tupu ọ nwuọ. Ihe a dị anyi nwute."

Achụzia so na ndị ịsị agha Biafra nụrụ ọgụ mnwere onwe n'afọ 1967.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a