Tottenham na-ele anya iburu iko FA na mmeri Rochadale

Son Heung-min onye Tottenham na ndị otu ya na-nwe anụrị mgbe o nyere goolu n'asọmpị iko FA. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Tottenham emerila n'asọmpị iko FA ugboro asatọ

N'egwuregwu, ndị otu Tottenham gbara ndị Rochadale ọkpụ goolu isii asatara otu n'asọmpi FA.

Mmeri a pụtara na Tottenham na otu Swansea ga-asọ mpi Quarter Final n'iko FA a ga-agba n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị.

Son Heung-min nyere goolu nke mbụ na nke ise. Fernando Llorente nyere goolu atọ n'ime nkeji iri na abụọ n'okara nke abụọ, ebe Kyle Walter-Peters nyere goolu nke isi.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Son Heung-min kwụsị bọọlụ otu Rochadale

Gịnị ga-eme n'ihu?

Tottenham ga-aga ọgbọ egwuregwu Wembley n'ụbọchị atọ nke ọnwa Maachị. Ha na Huddersfield ga-asọ mpi n'iko Premier League, tupu ha na Juventus ga-asọmpị nke ha n'iko Champions League n'ụbọchị asaa n'ọnwa Maachị.

Otu egwuregwu Rochdale nwere asọmpị 16 ịzọpụta onwe ha tụpụ ha baa relegation na league otu.

Asompị ha nke mbụ ga-abụ ha na Plymouth n'ụbọchị atọ n'ọnwa Maachị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara