Ọkụ agbala ahịa Timbershed n'Enugwu

Ahịa Timbershade dị n'Enugwu agbala ọkụ
Ọkụ ọgbụgba ahụ bidoro n'abalị ụnyaahụ gbawa, ma rue taa.
Mkpu akwa na ita ikikiri eze bụ nke na-ada na ya bụ ahịa n'ihi na ndị ahịa kwuru na ihe ha ji akpata ego agbapịala ghọrọ unyi na ntụ.
BBC Igbo rutere na ya bu Timbershade dị n'agbata Maryland dị n'Uwani, Enugwu, wee hụ na ya bụ ọkụ repịara Line 2 na Line 3 dị n'ahia ahụ nke ndị nwe ya ewepụtaghị ọbụladị otu ihe tupu ya bụ ọkụ erepịasịa ha.
Ahịa Timbershade dị n'Enugwu agbala ọkụ
Onye ode akwụkwọ otu ndị ahịa osisi bụ Enugwu Timber Union bụ Gilbert Nweke gwara BBC n'ebe ya onwe ya na-ere osisi gbapịakwara tọtọ nke na ya amaghịzị otu ya n'uwa ya ga-esi mee.
O tiri mkpu na ngalaba na-agbanyụ oku n'Enugwu steeti bụ Enugwu State Fire Service na bekee arụghị ọrụ ha ọfụma.
Ọ sịrị na ha abịaghị n'oge wee gbanyuo ya bụ ọkụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Ndị ọzọkwa na-azu ahịa na Timbershade ọdachi a dakwasara gụnyere Charles Eze, Tony Aja, Chukwunonso Nnamchi, Joseph Eze, Ifeanyi Eze, nakwa Tuface nwa Chineke kwuru na ha amaghị ihe kpatara ọkụ ahụ bụ nke ha kọwara na ọdịzị ka ọ bụ kwa afọ ka ọkụ ji emerụ ha ahụ nke ukwuu.
Ha rịọrọ gọọmenti ka o nyere ha aka ruo ụlọ ajaụpa esiri esi nke a kpọrọ 'bricks' n'ahia ahụ niile, ma tinye igwe na- agbanyụ ọkụ na transformer iji wee gbochie ọdachi a n'ọdịnihu.
Azụmahịa dịzị ka a ga-asi na ọ kwụsịrị na Timbershade,ndị ọ metụtara na-ajụ ihe ha ga-eme. Ebe ndị ometụghị na- asi, 'ọ bụkwaranu m?'