Mwakpo onye oyiegwu 'egbuola mmadụ 3 na Maiduguri'

Ebe ogbunigwe gbara Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ogbunigwe eyi ka akwa ka Boko Haram na-ejikarị awakpo obodo

Onye oyiegwu na-agba ịyịnyaigwe gbapụrụ ogbunigwe o kere n'ahụ wee gbuo onwe ya na mmadụ atọ ọzọ na Maiduguri dịka onye nchekwa nkịtị gwara ụlọọrụ ntaakukọ AFP.

Mmadụ iri na asatọ merụrụ ahụ na mwakpo a mere na mpaghara Maiduguri a na-akpọ Muna Dalti dịka Musa Ari, bụ onye nchekwa nkịtị so egbochi Boko Haram kwuru.

"Onye kpara ike a wakporo ebe ndị mmadụ gbakọrọ n'elekere 8:20 n'abalị wee gbuo mmadu atọ ma merụọ 18 ahụ," Ari kwuru.

"Ihe a bụ ọrụ ndị otu oyiegwu Boko Haram."

Ibrahim Liman, onye ọzọ na-arụkwa ọrụ nchekwa, kwuru na ogbunigwe a gbara mgbe onye kpara ike a na-agbafe ndị gbakọrọ agbakọ.

Na mpaghara Muna dị na Maiduguri ka ndị mmadụ gbara ọsọndụ maka akpamike Boko Haram bi. Ọ bukwa ebe eji ogbunigwe awakpo kwamgbe.

A wakpokwara ọdụ ụgbọala, ebe ndị agha na ndi nche ọzọ na-anọ nakwa ebe ndị gbara ọsọndụ a nọ ụbọchị ole na ole gara aga.

Ndị nchekwa kwuru n'oge ụka gara aga, ụmụnwaanyi ji ogbunigwe nwụrụ ka ha nọ njem iji ogbunigwe ahụ gbuo onwe ha na ọtụtụ mmadụ n'obodo Konduga di nso na Maiduguri.

Liman sị na akwa ndị biara ikpa ike jiri kpụchie onwe ha konyere na irir igwe dị na mgbidi eghiwere ije gbochie mwakpo Boko Haram.

Liman sị n'ụmụnwaanyi a "gbara ogbunigwe ha ka aghara inwụchi ha."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ndị agha Naịjirịra nakwa ndị gọọmenti na-ekwusiike na ndị Boko Haram abụghịzị ihe ekwesịrị ị na-atụ egwu ka-eji atụ ha egwu na mbụ.

Mana, n'ebe ndị Boko Haram adịghịzị ejidenwu ala dịka ha na-eme na mbụ, ha ka na-egosi na ha ka nwekwara ikike ịkpa ike.

N'ụbọchị 19 nke Febụwarị nke afọ a, ndị agha Boko Haram wakporo Dapchi dị na Yobe Steeti wee tọọrọ ụmụakwụkwọ 110.

Na Fraịde gara aga, ha wakporo Rann na Borno Steeti, wee gụọ ndị agha asatọ na ndị ọrụ enyemaka atọ, nke mere ka akwụsị ọrụ enyemaka n'obodo ahụ n'izuụka.