Ameenah Gurib-Fakim ga-arịtu n'ọchịchị mba Mauritius

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gurib-Fakim na-ekwu na o meghị ihe ọjọọ ọbụla

Ameenah Gurib-Fakim ekwela na ya ga-arịtụ n'ọkwa ọchịchị ebe ndị gọọmentị ya jisiịke na kwanye ya ọkụ n'ike.

Ndị gọọmentị ya na ndị anọghị n'ọchịchị n'obodo ya agwabuola ya mbụ sị ya ritue n'ọkwa ọchịchị mana ọ jụrụ ya ajụ.

Eboro ya ebubo na ọ mefuru ego enyere maka enyemaka ndịọzọ mana ọ na-ekwu kwa na o nweghị ihe ọjọọ o mere.

Ndịụlọ omeiwu n'ala ha na-eche ka emecha mmemme ị cheta ụbọchị ha nwere onwe ha bụ Independence Day n'olu bekee tupu ha ebido njem ị chutu ya.

Cheta na Gurib Fakim bụ nwaanyị mbụ ga a nọ n'ọkwa ọnyeisiala na mba Mauritius.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: