Buhari: Anyị ga-eji mkparịtaụka tọpụta ụmụakwụkwọ 110 a tọrọ

Muhammadu Buhari Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Bụharị: Anyị chọrọ ka agbọlata ụmụ anyị a tọrọ na ndụ

Okwu a pụtara ihe ka onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari na odeeakwụkwọ nke steeti nke Amerika bụ Rex Tillerson nwechara nzukọ n'Abuja taa.

N'ọnwa gara aga, ndị Boko Haram wakporo ma tọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị 110 n'ụlọakwụkwọ ha dị na Dapchi, Yobe steeti.

Ihe karịrị ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị otu narị ka na-efu kemgbe afọ anọ e jiri tọrọ ha n'ụlọakwụkwọ sekọndrị dị na Chibok, Borno steeti.

Dịka onye ntaakụkọ BBC bụ Will Ross siri kwuo, ndị ọchịchị Naijiria ma na izipụ ndị agha na ụgbọelu ha chụwa ndị agha jihad ji ụmụaka ahụ ga-enwe ihe ọghọm dị oke egwu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Onyeisialabụ Muhammadu Buhari sịrị na gọọmenti haraa mkparịtaụka kama iji ike ndị agha, na Naijiria na otu mba ndị ọzọ na-ejikọ aka na mgbarịtaụka ga-eme ka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị lọpụta n'aka ndị ji ha na enweghị mmerụahụ ọbụla.

Ọ sị: "Anyị na-agba mbọ ịkpachara anya anyị. Ọ ka mma ka akpọlata ụmụ anyị nwaanyị na ndụ."

Ụdị mkparịtaụka a mịtatụrụ mkpụrụ n'oge gara aga. Eji isi ndị Boko Haram nọ na mkpọrọ gbapụtara ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok.

Gọọmenti gọrọ agụgọ na onweghị ụgwọ ha kwụrụ iji mee nke a.