Trump na Tillerson: Trump achụọla Rex Tillerson n'ọrụ

Rex Tillerson Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Tillerson bịara Naịjirịa ụnyaahụ wee hụ onyeisiala Muhammadu Buhari

Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump nọ n'igwe twitter chụọ odeakwụkwọ mba ahụ bụ Rex Tillerson were onyeisi ndị ọrụ nchekwa CIA Mike Pompeo nọchie ya.

Onye nkwuchite ọnụ Tillerson kwuru na ọ matara maka ọchụchụ achụrụ ya oge ọ hụrụ ihe Trump dere na twitter ebe ọ na-ekele ya maka ọrụ ya dịka onye karịsịrị n'ọkwa na ịnọchiteanya mba US.

Tillerson bubu onyeisi ụlọọrụ ExxonMobil nwere ụfọdụ nghọtahie dị n'etiti ya na Trump n'afọ gara aga.

Trump họpụtakwara Gina Haspel ka ọ bụrụ nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisi ndị CIA.

Cheta na Tillerson na onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari nwere ọgbakọ n'Aso Rock Abuja ụnyaahụ oge Tillerson bịara Naịjirịa na njem ọ bịara na mpaghara Afrịka.

Tillerson bụ onye ahịa mmanụ nwetara ọkwa a naanị n'afọ gara aga.

Oge Trump na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụọnụ na mbara White House taa, o kwuru na nsogbu ya na Tillerson nwere rutere na nghọta ha abụọ.

"Ihe na-adabara anyị nkeọma mana anyị anaghị ekwekọta n'ụfọdụ ihe," ka Trump kwuru.

"Ile anya na atụmatụ gbasara Iran, echere m na ọ jọka. O nwere ike o chere na ọ dị mma.

"Achọburu m itisa ya maọbụ mee ya ihe mana o cheghi etu ahụ, nke a pụara na anyị anaghị echekọ echiche.

"Mana etua Mike, Mike Pompeo batara, anyị na-echekọ echiche, echere m na ọ ga-aga nkeọma".

Tillerson bụ onye ikpeazụ n'ọnụọgụgụ ọtụtụ ndị ọrụ Trump wegoter isi jiri aka ha gbaa onwe ha arụkwaghị m maọbụ Trump chụrụ n'ọrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara