Stephen Hawking- Ego ole ka ọ nwere?

Stephen Hawking na Britain Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E Jirila Stephen Hawking mee ọtụtụ ihe ngosi nke gụnyere The Simpsons, Red Dwarf nakwa Big Bang Theory

Onye ọkammụta Fiziks bụ nwafọ Britain a laala n'udo n'ụlọ ya na Cambridge n'isi ụtụtụ a, dịka ndị be ya siri kwuo.

Stephen gbara afọ 76 tupu ọ nwụọ.

Ihe e jiri mara nwaamadi a bụ nchọpụta o mere maka "oghere ojii" maọbụ "black Hole' ọ chọpụtara n'ime uwa, ya na akwụkwọ ndị o depụtara maka ihe ọmụmụ nke sayensị, ọkachasị nke akpọrọ 'A Brief History of Time'.

Ọkammuta a dara ọrịa akwara na-enweghị ngwọta mgbe ọ gbara afọ iri na abụọ (22).

Ndị dibia bekee gwara ya na o nwere afọ abụọ ibi n'eluuwa tupu ọ laa mụọ.

Mana nke a emeghị, mana ya bụ ọrịa kụzịrị ya ngwọrọ mee ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E jirila Stephen Hawking chọpụtara ọtụtụ ihe gbasara sayensi butere ya nsọpụrụ n'ụwa niile

N'okwu ụmụ ya bụ Lucy, Robert na Tim, has sịrị "na ọnwụ nna ha tata dị ha nwute nke ukwuu".

Ha tokwara nna ha maka mbọ, uchu na akọnauche ya nakwa ka o si akpa ọchị.

Iluokwu ejiri mara ya bụ nwaamdị bụ nke ọ sị na "ụwa a enweghị isi ma ọbụghị ebe obibi nye ndị ị hụrụ n'anya".

Hawking bụ onye mbụ malitere amụma nghọta "theory" nke igwe na eluụwa "cosmology".

Ihe ikwesiri ị ma maka Stephen Hawking

  • Stephen Hawking nwere $20 Million
  • A mụrụ ya na 8 Jenụwarị 1942 n'Oxford, England
  • Onwetere ohere ịgụ nachụral sayensị na mahadum Oxford n'afọ 1959 tupu o mee PhD ya na Cambridge
  • Na 1963 a chọpụtara na o nwere ọrịa nke a sị na ọ fọrọ ya afọ abụọ ibi n'ụwa
  • Ọ chọpụtara amụma nghọta nke na-egosi na onwere oghere dị n'eluụwa nke na-akwụ ụzụ n'afọ 174. A kpọrọ nchọpụta a"Hawking Radiation"
  • O bipụtara akwụkọ akpọrọ 'A brief History of Time' n'afọ 1988 nke regoro nde iri n'ahia
  • E jirila ya mee ihe onyonyo akpọrọ 'The theory of Everything' n'afọ 2014 nke Eddie Redmayne so na ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a