N'Oklahoma, otu nwaanyị ga-aga mkpọrọ maka ịlụ nwa ya

Patricia Ann Spann na nwa ya,Misty Dawn Spann Image copyright STEPHENS COUNTY JAIL
Nkenke aha onyonyo Nwaanyị a lụbụrụ nwa ya nwoke

Patricia Ann Spann, onye gbara afọ iri anọ na ise kwetara na ya na nwa ya nwaanyị bụ Misty Velvet Dawn Spann dị afọ iri abuo na isii, gbara akwụkwọ ma nwe mmekọrịta ndị bụ ọbara ya.

A nara nwaanyị a ụmụ ya ma ha bịakọrịtara ọnụ ọzọ n'afọ 2014.

Ha lụrụ onwe ha oge anabatara n'iwu nwaanyị ịlụ nwanyị maọbụ nwoke ịlụ nwoke ibe ya na mpaghara ahụ.

Ndị nyocha chọpụtara na Patricia Ann Spann lụburu nwa ya nwoke mgbe nke ahụ dị afọ iri na asatọ, ebe nwata nwoke agbụ bibiri njikọ ahụ n'afọ 2010.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka nleta chọpụtara maka nwaanyị ahụ na nwa ya oge ha jere nleta n'ụlọ ha.

Dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo, Misty Spann bibiri njikọ ya na nne ya n'ọnwa Ọctoba afọ gara aga ka nwechara ndọrịta ụka na nne ya jịrị aghụghọ duba ya na njikọ ahụ.

Misty Spann kwuru na nne ya tụrụ ya asị na ya na "ọkaiwu atọ kpara ndị nyere ya ndụmọdụ ya ga n'ihu na nsọgbụ adịghị na njịkọ ahụ".

Patricia Ann Spann kwuru na ya kwenyere na njikọ ha emegideghị iwu n'ihi na edebaghị aha ya n'akwụkwọ ọmụmụ nwa ya nwaanyị dịka nne mụrụ ya ebe ha zutere onwe ha afọ abụọ tupu ha ejikọ aka.

Misty Spann kwetara na ya mebiri iwu megidere mmekọrịta ndị bụ ọbara. E nyere ya afọ iri maka nyocha na nleta na aka ọchamara ihe gbasara akọ na uche.

Ebe nne ya bụ Patricia ga-atukwasị nyocha afọ asatọ n'elu mkpọrọ a tụrụ ya. A ga tinyekwa aha ya n'akwụkwụ dịka onye metọrọ mmadụ ma ọ pụta na nga.

N' iwu dị na mpaghara Oklahoma, mmadụ ịlụ ọbara ya bụ mmetọ ọbara ma ha enwere maọbụ na ha enweghị mmekọrịta ahụ ọbụla.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a