Bill Gate: Atụmatụ nhazi akụnaụba Buhari agaghị emetụ mkpa Naijiria

Bill Gates bụ osote onye kacha enwe ego n'ụwa niile Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Bill Gates bụ osote onye kacha enwe ego n'ụwa niile

Onye ọkacharamara n'ihe gbasara akụnaụba nke a kpọrọ 'economist' bụ Dr Uche Uwaleke, ekwuola na Bill Gate ekwutachaghị ihe o kwuru maka nhazi nkwalite akụnaụba Naịjiria.

Bill Gate kwuru n'Abuja na ụbọchị Tọọsde na atụmatụ nhazi akụnaụba Naijiria nke ọchịchị Muhammadu Buhari agaghị egbo mkpa ndị Najiria ugbua.

Dịka Gate siri kwuọ, atụmatụ nke Gọọmentị Buharị na-agbakwasa ụkwụ na iwulike ewumewu nke na-enyere akụnaụba aka ma hapụ iwulite ndị mmadụ site na itinye ego na agụmakwụakwu na ahụike.

Uwaleke,onye bụ ọkamụta na mahadum nke a kpọrọ, Nasarawa State University, Keffi na bekee sị : "Igbakwasị nkwalite akụnaụba na itinye ego na ewumewu na itinye ego na nkwalite mmadụ kwesịrị ịna agakọ.

"Ndị mmadụ, ebe enweghị okporoụzọ, ọdọ ụgbọmmiri na ụlọọrụ mmepụta ngwahịa na okporoụzọ, ọdọ ụgbọmmiri na ụlọọrụ mmepụta ngwahịa roads, ebe enweghị ndị ma ọrụ ga-elekọta ya agahi ewelite akụnụba."

Na mkparịtaụka ya na ọnyentakụkọ BBC nwere, Uwaleke kwuru na ihe Buhari na-etinye anya na ya ugbua dịka iru okporoụzọ, ọkụ na ihe dị ọzọ na kwalite akụnụba bụ ihe dị ala Naịjịrịa oke mkpa ugbua.

"Ihe mere anyi ji etinye ego na ewumewu bụ na ọ bụ ihe kachasị dị anyị mkpa ụgbụ a. ọbụghị na gọọment amaghị na agụmakwụkwọ dị anyị mkpa. Agụmakwụkwọ dịkwa mma,"

O kwuru na n'ihi ụkọ ego dịka Naijiria ka sicha na Riseshọn pụta ma bụrụkwa mba nwere sọọsọ otu ihe na-enye ya ego, ọ gaghị adịrị ya mfe ime ihe nile o kwesiri ime otu mgbe.

Akụkọ ga-amasị:

Isiokwu Ndị Emetụtara