Dapchi: Ndụ amalitela na Dapchi ọzọ

Dapchi na Yobe steeti
Nkenke aha onyonyo A tọrọ ụmụakwụkwọ ruru 110 na Dapchi na Ferburuwarị

Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na ebe niile dara jụụ n'obodo Dapchi ebe egwu na-atụ ndị mmadụ maka na ha nwetara ozi na ndị Boko Haram na-abịa ọzọ.

Onye nọ n'ebe ahụ gwara BBC na ndị mmadụ akpọchichala ọdọ ahịa ha ma kpochie ebe obibi ha.

O kwukwara na ndị agha Naịjiria nọ na Dapchi anọzịghị ebe ha kwesiri ị nọ na-eche nche na Dapchị.

Ndị Dapchi na-atụ egwu maka na ha amaghị ihe ndị Boko Haram na-abịa ịme, mana e chere na ọ bụ ịtọghapụ otu nwa nwaanyị fọrọ na ndị ha nwụchiri bụ Leah Shaibu.

Ndị ahụ alaghachitala ebe ha anụghị ụda ụkwụ ndị Boko Haram maọbụ hụ ha ka ha sị nụ na ọ ga-eme.

Ndị Boko Haram tọrọ ụmụakwụkwọ ruru otu narị na iri n'ọnwa Febụwarị ma tọghapụ ha ka izuụka atọ gachara.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara