Kriket: Warner ariọla mgbaghara

David Warner
Nkenke aha onyonyo David Warner tụrụ arịrị na n'ikekwa, ya aghaghị enwe ohere gbara Australia kriket ọzọ

A machiri Warner na onye bụbu kaptin otu ha bụ Steve Smith otu afọ maka ebubo ikpa bọọlụ aka dịka osi megide iwu n' asọmpi mere a Cape Town dị na Saut Afrika.

Warner kwuru na ya etinyela n'obi na e nwere ike ya aghaghị enwe ohere gbara Austrialia kriket ọzọ n'ihi akụkọ maka ebubo mmerụaka gbasara ịkpatụ bọọlụ aka nke a kpọrọ aha ya na ya.

Nwa amadị a dị afọ iri atọ rịọrọ mgbaghara n'ụbọchị Satọdee, kwetere na aka ya so dị n'ihe ahụ mere.

Ọ gara n'ihu kwuo sị: "Nanị ihe m chọrọ bụ iwetara ala m otito site ime egwuregwu kriket"

Smith na Cameron Bancroft ndị enyere mmachi ọnwa itoolu maka atụmatụ iji 'sandpaper' kwocha bọọụ oge ha na-eme ntule nke atọ ayọọlarị mgbaghara maka ihe ha mere

Ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu,Warner onye gụpụtara akwụkwọ ozi o dere sị "A na m arịọ ndị Australia niile, ndị egwuregwu krịket na-amasị maọbị ndị ọ naghị amasị, mgbaghara. ọ dị m obi mwute ihe m mere na-otu o siri metụta aha obodo anyị.

"ọ bụ ihe dị obi mgbawa ịma na m agaghị eso ndị otu egwuregwu anyị ndị m hụrụ n'anya ma na akwanyere ugwu, nakwa na m mere ha n'ala..

"Ọ bị ihe m ga-eme ngakwaramara ndụ m niile."

Nyocha otu na ahụ maka egwurekwu Kriket mere chọpụtara na Warner onye bụ osote kaptin otu egwuregwu ha kwara onye otu ya bụ Bancroft ka o were 'sandpaper' kwọcha bọọlụ ma gosi ya ka ọ ga-esi me ya.

A machiri ha abụọ na Smith onyebụ kaptin isonye n'egwuregwu kriket mba na mba ya na nke obodo ha bụ Australia.

Smith na Warner agghaghị esonye n'asọmpi Indian Premier League na-abịa, ebe ha abụọ tinyerela akwụkwọ alụkwaghị dịka kaptin ndị otu egwuregwu ha.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a