Naomi Campbell: Buhari akpasuola ndị Naijiria iwe

Naomi Campbell
Nkọwa foto,

Naomi Campbell bịara Legos maka emume gosi ejiji a kpọrọ A'rise Fashion Week' na Legos

Onyeisiala Muhammadu Buhari esila Legos lọghachi Abuja ka o mechara njem abalị abụọ ebe ahụ, mana okwu iwe banyere ijekọ ya na Naomi Campbell bụ ihe so njem ahụ.

N'ụbọchị Fraide, Gọvanọ Legọs bụ Akinwunmi Ambode kpọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari gagharịa Eko Atlantic City, dị na Victoria Island, Legos, ebe onyeisiala zutere nwada Briten ama ama bụ Naomi Campbell.

Nkọwa foto,

Ambode & Buhari during Eko Atlantic City.png

Eko Atlantic City bụ ebe a chọrọ irụ obodo ọhụrụ na Legos site n'ala awapụtara n'osimiri Atlantik nke e kwuru na opeka mpe mmadụ puku 250,(250, 000) ebi na ya, ebe ndị njem puku 150(150,000) gana-erute ebe ahụ.

Campbell kwupụtakwara nke nke a n'igwe Twitter ya:

Mana ndị Naijiria ụfọdụ na-ebo ebubo na a kwụrụ Campbell, onye biara Naijiria maka 'Arise Fashion Week,' nnukwu ụgwọ ji bịa ebe e mepere Eko Atlantic City.

Mana ndị ụlọọrụ onyeisiala gọrọ na ọbụghị ha kpọrọ Campbell oku.

Ọnụ na-echutere onyeisiala n'ihe gbasara sochal midia bụ Tolu Ogunlesi bara ndị na-akpọrị Naomi Campbeil na onyeisiala maka okwu ọjọọ ha na-ekwu.

Ọtụtụ bidoro ikpọrị ya sị na o ji maka nwaanyi na- akpọ ndị ala ya 'anụmanụ.'

Mana Ogunlesi kọwara na ya enweghị ike ịkpọ ndị Naijiria 'anụmanụ'.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: