Mmerụaka: Gọọmenti na-arụ ọrụ ndị ọkaikpe- Ndị ọkaiwu

Diezani Alison-Madueke, Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Diezani Alison-Madueke nwere ọtụtụ ebubu mmefu ego n'ụlọikpe na Naijiria na mba ofesi

Ndị ọkaiwu akatọọla gọọmentị etiti maka ịwepụta aha ndị ha boro ebubo iri ego ala Naịjirịa n'oge ọchịchị PDP.

Dịka ha siri kọwa, nke a megidere iwu Naijiria ma bụrụkwa ịma ngalaba na-ahụ maka ikpe nke a kpọrọ 'Judiciary' na bekee' aka n'ihu.

N'ụbọchị ụka, Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ, Lai Mohammed, wepụtara aha mmadụ iri abụọ na atọ (23) ndị gọọmenti etiti na-ebo ebubo na ha zuru ego ala Naijiria n'oge ọchịchị PDP.

O kwuru na aha ndị ahụ sitere na nyocha ndị EFCC mere nke gbadoro ụkwụ na N126bn, $1.5bn na £5.5m, ego so na $2.1bn a mapụtara maka izụ ngwaagha nke e mefuru site n'aka ụlọọrụ onye ndụmọdụ nchekwa obodọ bụ Sambo Dasuki.

Mohammed boro onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison-Madueke, ebubo na o mefuru N23bn n'ihe gbasara ọrụ ngo nke NNPC, ebe ụlọọrụ Jide Omokore na Jide Aluko nwetara 'oil blocks', mana hapụ ịkwụ gọọmenti ụtụ isi dị na ya.

Ndị a kpọrọ aha na ihe ha zuru

Ndị ọzọ aha ha dị n'akwụkwọ ebubo ahụ bụ:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Femi Fani-Kayode na Lt. Gen. Azubuike Ihejirika so na ndị rụrụ ọrụ oge ọchịchị nke Goodluck Jonathan
  1. Lt. Gen. Azubuike Ihejirika onye eboro na o mefuru N4.5bn nke EFCC natakwara N29m
  2. Alex Barde, onye bụbu onyeisi ndị ọrụ nchekwa, onye eboro na o zuru N8bn nke EFCC natara ihe ruru N4bn bụ ego a hụrụ anya na ụlọ
  3. Inde Dikko, onye bụbụ onyeisi ndị kọstọm, onye e boro na ọ narala N40bn nke a napụtara N1.1bn bụ egọ ahụrụ anya na ụlọ.
  4. Air Marshal Adesola Amosun, nwetara N21.4bn, ebe a natara ya N2.8bn bụ ego a hụrụ anya, ụlọ iri abụọ na asatọ (28) na ụgbọala atọ.
  5. Bala Abdulkadir, bụ onye bụbu mịnịsta isi obodo Abuja, onye e boro ebubo na ọ natara N5bn
  6. Stella Oduah, N9.8bn.
  7. Gọvanọ chịburu Niger steeti bụ Babangida Aliyu natara N1.6bn n'aka NSA
  8. Gọvanọ chịburu Plateau bụ Jonah Jang, nwetara N12.5bn
  9. Bashir Yuguda, onye bụbụ Mịnịsta nta na-ahụ maka ego nwetara N1.5bn, mana a natara ya $829,800.
  10. Femi Fani-Kayodeonye e boro na o mefuru N866m
  11. Peter Nwaboshi, N1.5bn
  12. Aliyu Usman, onye rụrụ Dasuki ọrụ, N512m
  13. Ahmad Idris, onye ọzọ rụrụ Dasuki dịka onye nyemaka, N1.5bn
  14. Rasheed Ladoja, onye bụbu gọvanọ Oyo steeti N500m
  15. Tom Ikimi, N300m.
  16. Nenadi Usman, N1.5bn
  17. Hassan Tukur, onye rụrụ Goodluck Jonathan, $1.7m
  18. Benedicta Iroha, N1.7bn
  19. Aliyu Usman Jawaz, enyi Dasuki, N882m
  20. Godknows Igali, N7bn
  21. Lt. Gen. Kenneth Minimah (retd.), onye bụbụ onyeisi ndị agha bụ onye EFCC napụtara N13.9bn na N4.8bn n'aka bụ ego a hụrụ anya n'ụlọ.

Na mkparitaụka ya na BBC nwere n'ekwenti, onye ọkaiwu bụ Festus Alika kwuru na ebubo ahụ achitaghị aja n'ihi na "ọ bụ nanị oge ụlọikpe mara mmadụ ikpe ime mpụ ka a ga-asị na o mere mpụ".

Onye ọkaiwu ọzọ ma bụrụkwa onye nkuzi na mahadụm, Nassarawa State University, bụ Chukwuemeka Eze kwuru na aka onye ọbụla eboro ebubo dị ọcha ruo oge ụlọikpe mara ya ikpe.

Ọ sị:"Gọọmenti etiti, ndị Ezekutivu na-arụzị ọrụ Judishịarị, n'ihi na Section 36 iwu Naijiria sịrị na onye ọbụla akpọọrọ jee ụlọikpe, a ga-ewe ya dịka aka ya dị ọcha ruo oge ụlọikpe sịrị na aka adịghị ya ọcha.

"Ọ bụghị gọọmentị ga-ekwu na ha rir ego ebe ikpe ha ka dị n'ụlọikpe. Etu a ha si mee ya, e kekọọla ndị ikpe aka na ụkwụ."

Eze kwuru n'ọbụ maka ihe gbasara ịzọ ọchịchị nke afọ 2019 dụnyere gọọmenti etiti iwepụta aha ndị ahụ ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị

Gere ihe Barr Chukwuemeka Eze kwuru n'uju:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Barr Chukwuemeka Eze kwuru gbasara gọọmentị etiti na ndị eboro ebubo mmefu ego.