Mmerụaka: PDP chọrọ ka INEC machie APC

Kola Ologbondiyan Image copyright Kola Ologbondiyan /Facebook
Nkenke aha onyonyo Kola Ologbondiyan bụ odeeakwụkwọ mgbasa ozi otu PDP

Otu PDP kwụpụtara nke a n'akwụkwọ ozi nke odeeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Kola Ologbondiyan, wepụtara n'ụbọchị Monde.

Ha nyekwara ụlọọrụ onyeisiala abali atọ iji saa ebubo na e ji ego ezutere ezute were kwado ntuliaka ya n'afọ 2015 e meghị etu a, ha edebanye aha onyeisiala n'isi ndị mefuru ego ala Naijiria.

Otu PDP kwuru na kama ụlọọrụ onyeisiala na otu APC ga-apụta za azịza maka etu onyeisiala jiri were ego na-ebo ebubo na-ezutere n'ego ala Naijiria, ha na-akpọ aha ndị ikpe ha ka nọ n'ụlọikpe.

"O doro anya na otu APC, gọọmenti etiti na Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed na-agba ọsọ n'okwu gbarar ka ha siri nweta ego ha jiri kwado Buhari ka o merie na ntuliaka iji bụ onyeisiala."

"Ha ma ụma na-apị aka mkpọchị ọgbaghara na ebubo achịtaghị aja megide ndị otu PDP iji mee ka ndị Naijiria na mba ụwa leghara anya na mpụ gọọmenti na ụzọ niile ha kụọ afọ n'ala dịka ndị ndụ."

"Ugbua APC, gọọmenti etiti, Alhaji Lai Mohammed na ụlọọrụ onyeisiala Buhari hara igbachị nkiti dara ụda mkama ikweta na ọ bụ ego ezuru ezu ka ha jiri kwado ịzọọ ọchịchị Buharị n'afọ 2015, Anyị na-akpọkụ INEC ka ha mee ihe kwesiri ime siter na ịmachị APC dịka ootu ndọrọndọrọ ọchịchị.

Cheta na abali ole na ole gara aga, gọọmentị etiti wepụtara aha ndị ha bọrọr ebubo na ha zuru ego Naijiria, nke otutu n'ime ha bụ ndị otu. PDP.

Akụkọ ga-amasị gị